Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’October 29, 2007. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri atọ. Ọ ga-adabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu September 3 ruo October 29, 2007.
NKÀ OKWU
1. N’ihi gịnị ka ikwughachi ihe ji bụrụ ụzọ dị mkpa isi zie ihe? [be-IB p. 206 para. 1-2, igbe]
2. Olee ụzọ ndị anyị pụrụ isi mesie isiokwu ike? [be-IB p. 210, igbe]
3. Olee ihe ndị na-abụ isi ihe n’okwu, oleekwa ihe na-eduzi anyị n’ịhọrọ ha? [be-IB p. 212 para. 1-3]
4. Olee ihe mere na anyị ekwesịghị iji ọtụtụ isi ihe eme ihe mgbe anyị na-ekwu okwu? [be-IB p. 213 para. 2-4]
5. Gịnị mere o ji dị mkpa ka okwu mmeghe anyị na-akpasu mmasị, oleekwa otú a pụrụ isi mee nke a? [be-IB p. 215 para. 1; p. 216 para. 1-3, igbe]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee otú Abụ Ọma 119:89, 90 si enyere anyị aka ịghọta na anyị pụrụ ịdabere n’Okwu Chineke? [w05 4/15 p. 15 para. 3]
7. Gịnị ka mmiri ahụ si n’ụlọukwu ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-erupụta na-ese onyinyo ya? (Ezik. 47:2-11) [w99 3/1 p. 18 para. 2]
8. Olee otú “Okwu Jehova” pụrụ isi chekwaa obi anyị? (Ọma 18:30) [w05 9/1 p. 30 para. 2]
9. Gịnị ka ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke taa pụrụ ịmụta site n’ọzụzụ e nyere Daniel, Shedrak, Mishak, na Abednego? [w88 12/1 p. 17 para. 10]
10. Ọ̀ bụ dabere na gịnị ka Jehova na-emere onye mmehie ebere? [w89 3/1 p. 15 para. 6]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Gịnị ka ịtụ ụlọukwu ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dị ka Ezikiel hụrụ n’ọhụụ pụtara, oleekwa otú nke a si emesi anyị obi ike taa? (Ezik. 40:2-5) [w99 3/1 p. 9 para. 6; p. 14 para. 7]
12. Ná mmezu ikpeazụ nke ọhụụ Ezikiel, ònye bụ “onyeisi” ahụ? (Ezik. 48:21) [w99 3/1 p. 16 para. 13-15; p. 22-23 para. 19-20]
13. Gịnị ka ihe e kwuru na Daniel 2:21 pụtara? [w98 9/15 p. 12 para. 9]
14. Olee ihe mere Daniel ji bụrụ “onye a na-achọsi ike nke ukwuu” n’anya Jehova? (Dan. 9:23) [dp p. 185 para. 12; w04 8/1 p. 12 para. 17]
15. Olee otú o si bụrụ na ọ dịghị “[ihe] ọmụma Chineke, dị n’ala” Izrel, oleekwa otú anyị kwesịrị isi lee okwu ndị ahụ anya n’onwe anyị? (Hos. 4:1, 2, 6) [w05 11/15 p. 21 para. 21; jd-E p. 57-58 para. 5; p. 61 para. 10]