Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na November: Akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Mgbe ị chọpụtara na ndị nwe ụlọ enweghị ụmụaka, nye ha broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, nyefee akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso ma ọ bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. January: E nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu afọ 1991 ma ọ bụ akwụkwọ ochie ọ bụla ọzọ e nwere n’ọgbakọ. Akwụkwọ ọzọ e nwere ike inyefe: Akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! February: Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. March: Nyefee akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbaa mbọ ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Bible.
◼ Ebe ọ bụ na a ga-enwe ngwụsị izu ise zuru ezu n’ọnwa December, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ E kwesịrị ide “Watch Tower,” dị ka mkpụrụ okwu abụọ, n’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla e ji nye onyinye ná mgbakọ distrikti na ndị a na-ezitere alaka ụlọ ọrụ.
◼ Ọ bụrụ na ọ dị ndị nkwusa na-edejupụtabeghị kaadị durable power of attorney (DPA) ha, a na-agba ha ume ka ha dejupụta ya. Kaadị DPA a ga-eme ka a ghara ịmanye gị ịnara ọbara ebe ọ bụ na iwu nyere gị ikike ịjụ ya ma ị chọọ. Ọ bụrụ na ọ dị ndị chọrọ enyemaka, ndị okenye ga-enyere ha aka.—Lee ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke December 2006.
◼ Ọ dịghịzi mkpa ka ndị nkwusa na-enye fọm Study Report (S-3) maka onye ọ bụla ha mụụrụ Bible n’ọnwa. Ma, ha ka kwesịrị ịdị na-edepụta mmadụ ole ha duziiri ọmụmụ Bible n’ebe ahụ a na-ede ya na fọm Field Service Report (S-4). Malite ugbu a gaa n’ihu, nanị ihe a ga na-eji fọm S-3 eme bụ idekọ ọnụ ọgụgụ ndị bịara ọmụmụ ihe ọgbakọ.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:
Mpịakọta Teta! 2006—Bekee
Mpịakọta Ụlọ Nche 2006—Bekee