Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na December 31, 2007. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri atọ, ọ ga-adaberekwa n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu November 5 ruo December 31, 2007.
NKÀ OKWU
1. Olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’uche iji hụ na anyị mechiri okwu anyị otú ga-abara ndị ọzọ uru? [be-IB p. 220 para. 4–p. 221 para. 3]
2. Olee otú anyị nwere ike isi hụ na ihe anyị na-ekwu n’ozi ubi ziri ezi? [be-IB p. 223 para. 2-4]
3. Mgbe anyị na-ekwu okwu n’ọgbakọ, olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ghọtara na ọgbakọ Jehova bụ “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu”? (1 Tim. 3:15) [be-IB p. 224 para. 1-4]
4. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-enyocha ma ihe anyị ga-ekwu ọ̀ bụkwa eziokwu, oleekwa otú anyị nwere ike isi nyochaa ya? [be-IB p. 225 para. 1, 2]
5. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ọ dịrị ndị na-ege anyị ntị mfe ịghọta ihe anyị na-akụzi? [be-IB p. 226 para. 3–p. 227 para. 1]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta site n’akwụkwọ Bible bụ́ Jona? [w89 4/15 p. 31 para. 2-5]
7. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta site n’akwụkwọ Bible bụ́ Maịka? [w89 5/1 p. 15 para. 1-7]
8. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta site n’akwụkwọ Bible bụ́ Habakuk? [w89 5/15 p. 25 para. 2-5]
9. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta site n’akwụkwọ Bible bụ́ Hagaị? [w89 6/1 p. 31 para. 5-7]
10. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta site n’akwụkwọ Bible bụ́ Malakaị? [w89 7/1 p. 31 para. 6]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Olee otú amụma Joel banyere mwakpo nke ụmụ ahụhụ si mezuo na narị afọ mbụ, oleekwa otú o si emezu taa? (Joel 2:1-10, 28) [w07 10/1 “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joel na Emọs”]
12. Gịnị ka “otu nkata mkpụrụ osisi nke mgbe nghọkọta mkpụrụ” na-egosi? (Emọs 8:1, 2) [w07 10/1 “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Joel na Emọs”]
13. Olee otú o si bụrụ na Jehova ‘chegharịrị uche banyere ihe ọjọọ ahụ nke o kwuru na ya ga-eme ndị Ninive,’ oleekwa otú nke a kwesịrị isi metụta anyị? (Jona 3:10) [w03 7/15 p. 17-18]
14. Olee ihe ijegharị n’aha Jehova pụtara? (Maị. 4:5) [w03 8/15 p. 17 para. 19]
15. Olee mgbe Jehova bịara ‘n’ụlọukwu’ ya maka ikpe ikpe n’oge anyị a, oleekwa otú o si bịa? (Mal. 3:1-3) [re p. 32 igbe; jd p. 179 para. 3–p. 181 para. 6]