Igbe Ajụjụ
◼ Olee mgbe e kwesịrị ịjụ alaka ụlọ ọrụ ajụjụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ, oleekwa otú e kwesịrị isi jụọ ya?
Kwa afọ, a na-ajụ alaka ụlọ ọrụ dị na Nigeria ọtụtụ puku ajụjụ banyere ihe dị iche iche ma ọ bụ na-arịọ ha ka ha nye ndụmọdụ otú a ga-esi dozie nsogbu dị iche iche. A na-eji akwụkwọ ozi na telefon ajụ ajụjụ ndị a. Obi na-adị anyị ụtọ inyere ụmụnna anyị aka mgbe ha nọ ná mkpa. Ma, ọtụtụ mgbe, e nwere ike inweta azịza nke ajụjụ ndị ahụ n’akpọtụrụghị alaka ụlọ ọrụ. Ọtụtụ ajụjụ ndị a na-ajụ anyị bụ ajụjụ ndị akwụkwọ anyị zara nke ọma, ọtụtụ nsogbu ndị a na-akọkwara anyị bụ nsogbu ndị okenye ọgbakọ, bụ́ ndị maara otú ógbè ha dị, ga-akasị mara otú a ga-esi dozie ya.
N’ihi ya, anyị na-atụ aro na mgbe ọ bụla i nwere ajụjụ, ka i buru ụzọ chọọ ya n’ebe e depụtara isiokwu dị iche iche na ebe e depụtara amaokwu Bible dị iche iche n’akwụkwọ bụ́ Watch Tower Publications Index. Isi otú a na-achọta azịza nke ajụjụ anyị na-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka iji aka ya emere onwe ya mkpebi ndị kwekọrọ ná ntụziaka Jehova. (Gal. 6:5) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka a kụziere gị otú e si eji Index achọta ihe, gakwuru otu n’ime ndị okenye ọgbakọ gị, ma ọ bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ka o nyere gị aka ịchọta azịza nke ajụjụ gị.
Ọzọ, mgbe i nwere nsogbu ma chọọ ka a dụọ gị ọdụ, ọ ga-adị mma ka i buru ụzọ gwa ndị okenye ọgbakọ gị ka ha nye gị ndụmọdụ ahụ. Ụmụnna ndị a maara gị, marakwa ọnọdụ gị; ha nọ n’ọnọdụ kasị mma iji Okwu Chineke nye gị ndụmọdụ dị gị mkpa. (Tụlee Ilu 27:23.) Cheta na ọ bụ Jehova mere ndokwa ka e nwee ndị okenye iji na-enyere ndị ya aka n’ofufe ha.—Aịsa. 32:1, 2; Jer. 23:4.
Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a ma i nwetaghị nkọwa ma ọ bụ ndụmọdụ dị gị mkpa, ma ọ bụ ya abụrụ na nsogbu gị dịgidere, gị enweekwa ezi ihe mere i ji chee na ị chọkwuru enyemaka, i nweziri ike ịgwa ya alaka ụlọ ọrụ. Ọ ga-akasị mma ma i detara anyị akwụkwọ ozi ma gwa anyị ihe nile merenụ otú ọ ga-edo anya. Ọ bụrụ na i kpebie ide akwụkwọ ozi, anyị na-atụ aro ka i mee ihe ndị a: kwuo aha gị, ọgbakọ gị na onye ọzọ ma ọ bụ ndị ọzọ okwu ahụ metụtara. Anyị anaghị elebara akwụkwọ ozi onye dere ya na-edeghị aha ya anya. Ajụla anyị ajụjụ banyere ihe ndị nwere ike ime eme n’abụghị ihe mere eme. Kwuo ihe otú o si mee, ekwula ihe ndị ị na-ejighị n’aka ma ọ bụ kọwa ihe ndị na-emetụtaghị okwu ahụ. Kọọ ihe ndị i merela iji dozie nsogbu ahụ na ihe mere i ji chee na i nwetaghị enyemaka ị chọrọ. A ga-agbalị ịgwa gị ụkpụrụ Bible ndị metụtara okwu ahụ. Ọ bụrụ na i dee akwụkwọ ozi banyere ndụmọdụ ndị okenye nyere gị, ọ ga-adị mma inye ha otu akwụkwọ ozi ahụ. Biko akpọla anyị na telefon, ọ gwụla ma ọ bụ okwu chọrọ ime ihe ozugbo banyere ya.