Na-amụkọnụ Okwu Chineke Ọnụ n’Ezinụlọ Unu
1 Jehova echetarala ndị isi ezinụlọ ugboro ugboro ka ha na-akụziri ụmụ ha ihe. O nyere Ebreham ọrụ nke ịkụziri ezinụlọ ya ihe ka ha wee “debe ụzọ Jehova.” (Jen. 18:19) E nyere ndị mụrụ ụmụ n’Izrel iwu ka ha jiri ohere ọ bụla ha hụrụ na-akụziri ụmụ ha ihe. (Deut. 6:6, 7) A dụrụ Ndị Kraịst bụ́ ndị isi ezinụlọ ọdụ ka ha na-azụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Efe. 6:4) Ùnu na-eme nke a site n’inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya? Ya bụrụ nanị nne ma ọ bụ nna nọ n’eziokwu, ọ bụ ya kwesịrị ịdị na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ. Ọ bụrụ na di na nwunye enweghị ụmụ, ha abụọ kwesịrị ịdị na-amụkọta ihe ọnụ.
2 Mgbe A Ga-eji Mụọ Ihe: Ọ kasị mma ka mmadụ nile nọ n’ezinụlọ kwekọrịta mgbe ga-akasịrị ha mma inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. Ọ na-amasị ụfọdụ ndị inwe ọmụmụ ihe ahụ n’ụtụtụ mgbe ọ na-adịbeghị ihe ọzọ ha na-eche, ndị ọzọ na-ahọrọkwa oge mgbede bụ́ mgbe mmadụ nile na-anọ n’ụlọ. Dabere n’ọnọdụ ezinụlọ nọ na ya, ezinụlọ ụfọdụ nwere ike ime ndokwa ịdị na-amụ ihe kwa izu; ndị ọzọ nwere ike ịdị na-amụtụ obere kwa ụbọchị. Meenụ ka oge unu na-eji amụ ihe kwekọọ n’afọ ndụ ụmụ unu. Ọ bụ ezie na ọ dị mma ịgbanwe oge unu ji amụ ihe mgbe ụfọdụ, gbalịanụ inwe otu oge unu ga na-eji amụ ihe. Onye nke ọ bụla nọ n’ezinụlọ ahụ kwesịrị ịnọ ya ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè.
3 Ihe A Ga-amụ: Unu nwere ike ịkwadokọta Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ma ọ bụ Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ọnụ. Unu nwere ike iji akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ma ọ bụ Akụkọ Bible mụọrọ obere ụmụaka ihe. Iji akwụkwọ bụ́ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị na isiokwu ndị dị na Teta! ndị ọhụrụ amụrụ ndị dị afọ iri na ụma ihe ga-abara ha uru. Mgbe e nwere nsogbu ụfọdụ, dị ka ihe ndị mere n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ nsogbu metụtara àgwà, họtanụ isiokwu ndị kwekọrọ ná nsogbu ahụ ma mụọ ya. Mgbe ọ bụla a ga-agbanwe ihe a ga-amụ, gwanụ ezinụlọ ihe a ga-amụ n’oge. Mgbe unu mụsịrị ya, laghachinụ n’akwụkwọ unu na-amụbu. Hụnụ na onye nke ọ bụla nọ n’ezinụlọ ahụ nke maara otú e si agụ ihe nwere Bible na akwụkwọ a ga-amụ. Ya bụrụgodị na ndị mụrụ ụmụ amaghị akwụkwọ ma ọ bụkwanụ na ha agụghị oké akwụkwọ, ụmụ ha nwere ike ịdị na-agụpụta ihe ndị a na-amụ. Ụmụaka ekwesịghị ịdị na-eleda ndị nne na nna ha bụ́ ndị na-agụghị akwụkwọ anya. Chetanụ na Ndị Efesọs 6:2 kwuru, sị: “‘Sọpụrụ nna gị na nne gị’; nke bụ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nwere nkwa.”
4 Meenụ Ka A Na-amụta Ihe n’Ọmụmụ Ihe ahụ Nakwa Ka Ọ Na-atọ Ụtọ: Meenụ ka ahụ́ na-eru onye ọ bụla ala, ma, unu ekwela ka ọ ghọọ ihe egwuregwu, ka ụmụaka nwee ike ịmụta ihe a na-akụzi. O kwesịghị ịdị ka okwu ihu ọha ma ọ bụkwanụ nanị ajụjụ na azịza. O kwesịrị ịbụ ebe onye ọ bụla na-etinye ọnụ n’okwu ma na-amụta ihe! Iji mee ka ụmụ unu ghọta ụkpụrụ Bible dị n’ihe ahụ a na-atụle, na-ajụnụ ha ajụjụ ndị ga-enyere ha aka iche echiche na ndị ga-enyere unu aka ịmata ihe ha na-eche, na-emekwanụ ka ha nwere onwe ha ịza ajụjụ. O kwesịghị ịbụ onye na-eduzi ya ga-ekwu ihe nile. Ọzọkwa, unu ejila ọmụmụ ihe ezinụlọ adọ ụmụ unu aka ná ntị ma ọ bụ ata ha ahụhụ.
5 Ihe mgbaru ọsọ anyị n’iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ bụ: ime ka a hụ Jehova n’anya, ime ka a ghọta ihe ndị Chineke chọrọ anyị n’aka nke ọma, na inyere mmadụ nile aka itinye ihe ndị ha na-amụ n’ọrụ n’ụzọ ga-abara ha uru. Gbalịanụ ime ka ụmụ unu nwee nnọọ obi ụtọ maka ihe nile Jehova na-emere anyị. Jidenụ n’aka na ha ghọtara ihe a mụrụ. Nyerenụ ha aka ịhụ uru ihe ahụ a mụrụ bara bụ́ nke ga-eme ka ha mee mgbanwe ndị dị mkpa n’àgwà ha.
6 Ọ bụrụ na unu amalitebeghị inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ, ọ́ gaghị adị mma ka unu malite ya tupu ọnwa a ana-agwụ? Ka unu na-ekpegara Jehova ekpere ka o nyere unu aka ná mgbalị unu na-eme ịmalite ya, obi sie unu ike na Jehova ga-agọzi ezinụlọ unu ka unu na-akụziri ha ‘idebe ụzọ Jehova.’