Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/08 p. 2-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 1/08 p. 2-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na January: E nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu afọ 1991 ma ọ bụ akwụkwọ ochie ọ bụla ọzọ e nwere n’ọgbakọ. Akwụkwọ ọzọ e nwere ike inyefe: Akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! February: Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. March: Nyefee akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbaa mbọ ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! A ga-eme mgbalị pụrụ iche ileta ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs na okwu ihu ọha pụrụ iche bụ́ ndị na-anọghị n’ọgbakọ. Ihe a ga-ebu n’obi mee nleta ahụ bụ ịmalitere ndị a na-amalibeghịrị ọmụmụ Baịbụl ọmụmụ Baịbụl.

◼ Ebe ọ bụ na ọnwa March nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

◼ Malite na February, n’agafeghịkwa March 2, isiokwu okwu ihu ọha ọhụrụ ndị nlekọta sekit ga na-ekwu ga-abụ “Olee Ebe Ị Ga-esi Nweta Enyemaka n’Oge Ị Nọ n’Ahụhụ?”

◼ Ọgbakọ niile kwesịrị ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị iji mee Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a na Saturday, March 22, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na e nwere ike ịmalite okwu mgbe anyanwụ na-adabeghị, mbugharị nke ihe nnọchianya ndị ahụ ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Ọgbakọ nke ọ bụla kwesịrị ime Ncheta Ọnwụ Jizọs nke ha iche. Otú ọ dị, nke a nwere ike ọ gaghị ekwe omume mgbe niile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ikekwe otu ọgbakọ ma ọ bụ karịa pụrụ inweta ebe ọzọ ha ga-eji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere mee, anyị na-atụ aro ka a nọọ, ọ dịkarịa ala, nkeji iri anọ e mesịrị otu tupu a na-amalite ọzọ ka mmadụ niile nwee ike ikele onwe ha mgbe Ncheta Ọnwụ Jizọs gasịrị. E kwesịkwara ichebara ndị na-agafe agafe na ebe a ga-adọba ụgbọala echiche, gụnyere ibusa na iburu ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma n’ógbè ha.

◼ Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ na ha nwere akwụkwọ ozi e ji ahọpụta ndị ọsụ ụzọ (S-202) maka onye ọsụ ụzọ oge niile ọ bụla nọ n’ọgbakọ ha. Ọ bụrụ na unu enweghị ya, biko detaranụ alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ maka ya.

◼ Malite n’izu nke August 4, 2008, anyị ga-amụ akwụkwọ bụ́ Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-adị Ndụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.

◼ A jụọla ajụjụ banyere onye ruru eru inweta akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nakwa nke bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova. Akwụkwọ ndị a abụghị maka ọhaneze, n’ihi ya kwa, anyị ekwesịghị inye ya ndị gosiri mmasị mgbe anyị nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ mgbe anyị na-eme nletaghachi, anyị ekwesịghịkwa inye ya ndị enyi anyị. Akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi bụ naanị maka ụmụ akwụkwọ nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. A bịa n’onye ruru eru inweta akwụkwọ Ndị A Haziri, akwụkwọ ahụ n’onwe ya kwuru na peeji nke 82, paragraf nke 1, sị: ‘Ozugbo ndị okenye ahụ kpebiri na onye ahụ a na-amụrụ Baịbụl ruru eru ije ozi ubi, e kwesịrị inye ya otu akwụkwọ a bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.’ N’ihi nke a, e kwesịghị idebe akwụkwọ ndị a n’ebe a na-ewere akwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

◼ DVD Ọhụrụ E Nwere:

The Bible—A Book of Fact and Prophecy—On DVD (dvbbl) (DVD a nwere fim atọ n’ime ya, ha bụ, The Bible—Accurate History, Reliable Prophecy; The Bible—Mankind’s Oldest Modern Book; The Bible—Its Power in Your Life)

◼ Ná mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị a ga-enwe n’afọ 2008, sekit ndị na-esonụ ga-enwe ebe e debeere ndị ntị chiri oche, a ga-eji asụsụ ndị ogbi (ASL) tapịaara ha ihe omume ahụ:

Akabo (EE-08) March 29 na August 16-17

Akure (WE-12) April 19 na August 23-24

Awi (EE-21) March 16 na June 7-8

Badagry (WE-02) May 3 na August 16-17

Badagry (WE-04) February 2-3 na June 7

Badagry (WE-14) May 4 na September 6-7

Badagry (WE-23) February 9-10 na June 8

Benin City (ME-01) April 27 na September 27-28

Daluwon (WE-01) May 3-4 na August 16

Daluwon (WE-03) May 10-11 na August 17

Daluwon (WE-13) March 1-2 na June 15

Daluwon (WE-22) June 7-8 na September 14

Daluwon (WE-29) June 29 na September 27-28

Enugu (EE-17) May 25 na September 27-28

Enugu (EE-19) April 13 na July 12-13

Ibadan (WE-09) March 9 na August 2-3

Ibadan (WE-10) April 6 na September 6-7

Igwuruta Ali (EE-22) March 15-16 na August 9

Ilesa (WE-15) March 29-30 na July 5

Ilorin (WE-17) March 2 na July 19-20

Kaduna (NE-01b) April 12-13 na August 23

Ota (WE-05) February 3 na June 21-22

Ota (WE-06) March 8-9 na June 28

Ota (WE-07) February 10 na July 12-13

Ota (WE-25) February 16 na July 19-20

Ubogo (ME-07) March 29-30 na July 12

Uli (EE-24) February 10 na June 28-29

Uyo (EE-20) March 1-2 na June 22

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya