Igbe Ajụjụ
◼ Olee akwụkwọ abụọ e kwesịrị iji mụọrọ ndị nwere mmasị ihe?
Akwụkwọ Bible Na-akụzi bụ akwụkwọ bụ́ isi anyị ji eduziri mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na e nwere ike iji akwụkwọ ọzọ, dị ka traktị dabara adaba, malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl, e kwesịrị ịgba mbọ gafee n’akwụkwọ Bible Na-akụzi ngwa ngwa o kwere mee. E nweela ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha a rụpụtara site n’iji akwụkwọ Bible Na-akụzi amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl.
A mụchahaala akwụkwọ Bible Na-akụzi, ya abụrụkwa na onye a na-amụrụ ihe na-enwe ọganihu, e kwesịrị ịmụwaziri ya akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. (Kọl. 2:7) Peeji nke 2 nke akwụkwọ ahụ kwuru ihe mere e ji bipụta ya, sị: “Bible na-agba ndị nile hụrụ Chineke n’anya ume ka ha ‘jiri uche ghọta . . . ịdị elu na ịdị omimi’ nke eziokwu ya ndị dị oké ọnụ ahịa. (Ndị Efesọs 3:18) A kwadebewo akwụkwọ a iji mezuo nke ahụ. Anyị nwere olileanya na ọ ga-enyere gị aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ ma bụrụ onye a kwadebere nke ọma karị ịga ije n’ụzọ ahụ dị warara nke na-eduga ná ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke.”
Ọ bụrụ na onye ahụ a na-amụrụ ihe eruo eruo ka e mee ya baptizim tupu ya amụchaa akwụkwọ abụọ ahụ, e kwesịrị ịnọgide na-amụrụ ya ihe ruo mgbe ọ mụchara akwụkwọ nke abụọ ahụ. N’agbanyeghị na e meela onye ahụ a na-amụrụ ihe baptizim, onye na-amụrụ ya ihe ka nwere ike ịgụrụ oge o ji mụọrọ ya ihe, gụrụ nletaghachi, na ọmụmụ Baịbụl. Onye nkwusa so onye ahụ gaa duzie ọmụmụ ihe ahụ ma kere òkè na ya nwekwara ike ịgụrụ oge e ji mụọrọ onye ahụ ihe.