Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na September: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’oge mbụ ị gara na nke ha. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ enweela akwụkwọ a enwee, mee ka ha hụ otú ha pụrụ isi rite uru na ya site n’igosi ha, n’ụzọ dị nkenke, otú e si eji ya amụ Baịbụl. October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe ndị mmadụ gosiri mmasị, nye ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma kọwaara ha ihe dị na ya iji mara ma ị̀ ga-amalite iduziri ha ọmụmụ Baịbụl. November: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekwuo na ha nwere ụmụaka, nye ha akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ.
◼ Ebe ọ bụ na November nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge e ji echeta ọnwụ Jizọs n’afọ 2009 n’izu nke April 20, 2009. A ga-agwa unu isiokwu ya ka oge na-aga. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ ná ngwụsị izu ahụ ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu April 20.
◼ Onye onyeisi oche ndị nlekọta họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ nke ọnwa June, July, na nke August. Ọ bụghị otu onye ahụ kwesịrị inyocha nke na-eso ya. Mgbe e nyochasịrị ya, e kwesịrị ịma ọkwa na e nyochaala ya mgbe ọzọ a ga-agụrụ ọgbakọ akụkọ ndekọ ego.—Lee Instructions for Congregation Accounting (S-27).
◼ Biko burunụ n’uche na ọ bụ Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ, ọ bụghị odeakwụkwọ naanị, kwesịrị ịbịanye aka n’akwụkwọ ozi e ji akọwa ndị nkwusa gafere n’ọgbakọ ọzọ. Ha atọ kwesịrị ịbịanye aka na ya ma onye ahụ ọ̀ bụ onye a họpụtara ahọpụta ma ọ bụ na ọ bụghị. Tupu ndị okenye nọ na kọmitii ije ozi abịanye aka n’akwụkwọ ozi ahụ, ha kwesịrị ijide n’aka n’akwụkwọ ozi ahụ nwere ihe ndị a dị mkpa: (1) ụbọchị e dere ya, (2) aha ọgbakọ na adres ya, nakwa (3) aha zuru ezu nke onye nkwusa ahụ na adres nke ọgbakọ ọhụrụ ya.
◼ A na-echetara ndị okenye ka ha mee ndokwa iji fọm bụ́ Ndepụta nke Ihe Ndị A Ga-enyocha Maka Nlekọta nke Ụlọ Nzukọ Alaeze (CN-14) mee nnyocha a na-eme kwa afọ banyere ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze. Iji mee nke a nke ọma, ndị okenye kwesịrị iso ntụziaka ndị dị n’akwụkwọ ozi e degaara òtù ndị okenye niile n’August 1, 2007. Mgbe e mechara nnyocha ahụ, e kwesịrị idejupụta akwụkwọ ndepụta ahụ, bịanye aka na ya, ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ na September 30 ma ọ bụ tupu mgbe ahụ.
◼ Iji nyere ndị nkwusa na ndị nwere mmasị kpuru ìsì ma ọ bụ ndị na-adịghị ahụcha ụzọ nke ọma bụ́ ndị na-eji ihe ndị e ji edetu ihe ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì ma ọ bụ kọmputa ndị na-akpọpụta okwu eme ihe aka inweta magazin ndị nke aka ha, e meela ndokwa inwe Ụlọ Nche ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì e nwere ike iji kọmputa kpọọ. Ihe ndị ga-adị na ya ga-abụ Ụlọ Nche nke ọhaneze na nke a na-amụ amụ nke dị na Grade 2, ma ọ bụ nke e debiiri okwu ndị dị na ya edebiri, n’asụsụ Bekee na Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ nke dị na Grade 1, ma ọ bụ nke e depụtara ihe niile edepụta na ya, n’asụsụ French na Spanish. A ga-eji e-mail zitere ndị rịọrọ maka magazin ndị a ihe ha rịọrọ. Ndị chọrọ inweta Ụlọ Nche ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì kwesịrị ịgwa odeakwụkwọ ọgbakọ ha ka o zite akwụkwọ ozi banyere ya na P.M.B. 1090, Benin City 300001, Edo State; dee n’elu envelopu ya “Attention: Braille Desk.” Akwụkwọ ozi ahụ kwesịrị inwe aha onye ahụ na adres ụlọ ya, aha ụdị ngwá ọrụ elektrọnik ọ ga-eji akpọ ya, adres e-mail ya, akwụkwọ ozi ahụ kwesịkwara ikwu ma onye ahụ ọ̀ na-aghọta asụsụ ndị ìsì n’asụsụ Bekee, Spanish, ka ọ̀ bụ n’asụsụ French. Ọ bụrụ na onye ahụ agaghị enwetali ozi e-mail, e kwesịrị inye anyị adres e-mail nke onye nwere ike inwetara ya magazin ndị ahụ na kọmputa ma nye ya ha.
◼ Compact Disc na DVD Ndị Ọhụrụ E Nwere:
Bible Dramas—MP3 (Nke nwere ihe nkiri iri na anọ n’otu efere egwú)—Bekee
Pursue Goals That Honor God (Nke dị na DVD)—Bekee
To the Ends of the Earth na United by Divine Teaching (Ndị dị na DVD)—Bekee, French, German, Italian, Japanese, Portuguese, Spanish
Watchtower Library—2007 Edition (CD-ROM)—Bekee
Young People Ask—How Can I Make Real Friends? (Nke dị na DVD)—Bekee, French, German, Italian, Japanese, Portuguese, Russian, Spanish