Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’October 27, 2008. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri atọ, ọ ga-adaberekwa n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu nke September 1 ruo October 27, 2008.
NKÀ OKWU
1. Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta ihe mere ndị mmadụ ji kwere n’ihe ha kweere? [be-IB p. 259 para. 2, 3]
2. Olee otú anyị nwere ike isi nyere mmadụ aka iwepụ ịkpọasị n’obi ya? [be-IB p. 260 para. 2]
3. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka inyocha obi ha iji wee nwee ike ịnọgide na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ? [be-IB p. 261 para. 3]
4. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi ka anyị na-agbalị ime ka ihe anyị na-akụziri ndị na-ege anyị ntị baa ha n’obi? [be-IB p. 262 para. 5]
5. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-echebara idebe oge mgbe anyị na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe echiche? [be-IB p. 263 para. 1, 3, igbe]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee ihe kpaliri Pọl ide akwụkwọ ozi mbụ o degaara Ndị Kọrịnt? [w90 9/15-IB p. 24 para. 3]
7. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị mere Pọl ji dee akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kọrịnt? [w90 9/15-IB p. 26 para. 2]
8. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị tinye ndụmọdụ Pọl nyere n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kọrịnt n’ọrụ? [w90 9/15-IB p. 27 para. 4]
9. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Filipaị? [w90 11/15-IB p. 25 para. 7]
10. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Tesalonaịka? [w91 1/15-IB p. 22 para. 8]
ỌGỤGỤ BAỊBỤL DỊỊRỊ IZU
11. Gịnị ka ‘inyefe nwoke ahụ na-eme ihe na-adịghị mma n’aka Setan ka e bibie mmetụta anụ ahụ́ na-enwe, ka e wee chebe ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ’ pụtara? (1 Kọr. 5:5) [w08 7/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt”]
12. Ugboro ole ka a ga na-echeta ọnwụ Jizọs, ‘ruokwa’ ole mgbe? (1 Kọr. 11:26) [w08 7/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt”]
13. Ọhụụ gịnị ka e kwuru okwu ya ná 2 Ndị Kọrịnt 12:2-4, ònyekwa ka ò yiri ka ọ̀ bụ ya hụrụ ọhụụ ahụ? [w04 10/15-IB p. 8 para. 4; p. 10 para. 9]
14. Gịnị mere Pọl ji jiri Iwu Mozis tụnyere ‘onye nduzi nke na-eduru anyị gakwuru Kraịst’? (Gal. 3:24) [w08 3/1-IB p. 18-21]
15. Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kpere ekpere sị “ka mmụọ na mkpụrụ obi na ahụ́ unu bụ́ ụmụnna anyị bụrụ nke e chebere”? (1 Tesa. 5:23) [w08 9/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ ozi Abụọ E Degaara Ndị Tesalonaịka nakwa Abụọ E Degaara Timoti”]