Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/09 p. 7
  • Kpachara Anya Maka “Ụmụnna Ụgha”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Maka “Ụmụnna Ụgha”
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 9/09 p. 7

Kpachara Anya Maka “Ụmụnna Ụgha”

1. Gịnị ka Pọl onyeozi kwuru banyere “ụmụnna ụgha”?

1 Pọl onyeozi kwuru na “ụmụnna ụgha,” ndị gbebatara n’ọgbakọ so ná nsogbu ndị o nwetara mgbe ọ na-eje ozi ya. O kwuru na ọ bụrụ na a kpachaghị anya, ha ‘ga-eji nwayọọ gbebata’ ma mebie ihe. (2 Kọr. 11:26; Gal. 2:4) Ọ ga-abụ na ndị a kpataara Pọl ezigbo isi ọwụwa na obi mgbu.

2. Olee ihe ndị anyị na-ahụ n’oge anyị a?

2 N’oge anyị a, e nweela ụfọdụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ndị mere ka hà bụ Ndịàmà Jehova ma tinye ụfọdụ ụmụnna anyị ná nsogbu. Ụmụnna ụgha ndị a nwere ike ịgwa ụmụnna anyị na ha nwere ihe mberede okporo ụzọ, ma ọ bụ na-arịa ọrịa n’otu ụlọ ọgwụ dị nso, ma chọọ ka e nyere ha aka. Ndị ọzọ nwedịrị ike ịgwa ụmụnna anyị na ha buteere ha ahịa ga-enye ha ezigbo ego. Mgbe ụfọdụ, ụmụnna ụgha a na-abịakwute ụmụnna anyị ma ọ bụ zigara ha ozi e-mail, gwa ha na e nwere nwanna ahụ́ na-adịghị nke chọrọ enyemaka. Ha na-agwazi onye chọrọ inye aka nọmba ha ga-eji kwụnye ego n’ụlọ akụ̀.

3. Ànyị kwesịrị ikwe ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Ndị Kraịst ibe anyị nọ belata n’oge ikpeazụ a? Kọwaa.

3 Ka ọgwụgwụ oge ikpeazụ a na-eru nso, a chọrọ ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Ndị Kraịst ibe anyị nọ “na-abawanye ụba.” (Fil. 1:9) Ma ndị ajọ omume na ndị nduhie ga na-ajọwanye njọ. (2 Tim. 3:13) N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi zere ndị ajọ mmadụ a, hụkwa na anyị na-enyere ụmụnna anyị ndị nọ n’ezigbo mkpa aka otú a chọrọ ka Ndị Kraịst na-eme?—Mat. 10:16, 17; Jems 2:15, 16.

4. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị kpachara anya? (b) Olee otú anyị ga-esi na-eme ihe e kwuru na Job 34:3?

4 Ihe O Ji Dị Mkpa na Anyị Ga-akpachara Anya: Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị inyowe onye ọ bụla anyị hụrụ enyowe, ma ọ dị mkpa na anyị ga-akpachara anya, na-eche nche mgbe niile, ghara ‘ịna-ekweta okwu niile’ mmadụ gwara anyị, ka anyị ghara ịdaba n’aka ndị aghụghọ. (Ilu 14:15) Okwu Chineke gwara anyị ka anyị buru ụzọ nwalee ihe mmadụ kwuru kama ikweta ihe ọ bụla anyị nụrụ n’ajụghị ase. “Ntị na-anwale okwu, dị ka okpo ọnụ si anụ ụtọ ihe mgbe a na-eri nri.” (Job 34:3) Nke ahụ ọ́ bụghị eziokwu? Dị nnọọ ka anyị na-ebu ụzọ edetụ nri ọnụ tupu anyị eriwe ya, ó kwesịghị ekwesị na anyị ga-anwale okwu ndị mmadụ na-agwa anyị tupu anyị ekwere ihe ha kwuru?

5. Olee ihe anyị kwesịrị ime iji mata ma mmadụ ọ̀ bụkwa ezigbo Onyeàmà?

5 Onye bụ́ ezigbo nwanna agaghị ewe iwe ma anyị jụọ ya ajụjụ ụfọdụ iji chọpụta ma ọ̀ bụkwa ezigbo nwanna. Pọl onyeozi dụrụ anyị ọdụ, sị: “Nwaleenụ ihe ọ bụla nke ọma.” (1 Tesa. 5:21, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik) Okwu Grik Pọl onyeozi dere ebe a, bụ́ nke a sụgharịrị ‘nwalee’ ka a na-ejikwa akọwa otú e si anwale ọla mgbe a chọrọ ịchọpụta nke bụ́ ezigbo ya. N’ihi ya, ka anyị ghara ịdaba n’aka ndị ọjọọ, ọ dị mma ịchọpụta ma mmadụ ọ̀ bụkwa ezigbo nwanna.

6. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-enyere ndị mmadụ aka? (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enyere ụmụnna anyị aka?

6 Ọ bụrụ na anyị ana-enyere ndị bụ́ ezigbo ụmụnna anyị aka, anyị ga-abụrụ ha “enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” (Ilu 18:24) Ihe ọzọkwa bụ na hanwa ga-agbatara anyị ọsọ enyemaka mgbe anyị nọ ná mkpa. Dị ka Luk 6:38 si kwuo ya, ha ga-eji ‘ihe anyị ji atụ̀ ihe tụọkwara anyị ihe.’ Ka anyị na-emere ndị mmadụ ihe ọma, nke bụ́ otu ụzọ anyị si efe Chineke, ọ dị mkpa ka anyị kpachara anya.—Jems 1:27.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya