Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na December 28, 2009.
1. Olee otú Ndị Kraịst taa nwere ike isi mee ihe e kwuru na Diuterọnọmi 14:1? [w05 1/1 p. 28; w04 9/15 p. 27 para. 5]
2. Olee otú ihe e kwuru na Diuterọnọmi 20:5-7 nwere ike isi gbasa ọgbakọ Ndị Kraịst taa? [w04 9/15 p. 27 para. 6]
3. A bịa n’okwu gbasara ịlụ agha, olee otú ndị Izrel si dị iche ná mba ndị ọzọ? (Diut. 20:10-15, 19, 20; 21:10-13) [cl p. 134-135, para. 17]
4. Gịnị nwere ike inyere anyị aka iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi? (Diut. 28:47) [w95 1/15 p. 16 para. 4-5]
5. Olee ihe ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’ihe e dere na Diuterọnọmi 32:9, 11, 12, bụ́ nke kọwara otú Jehova hụruru mba Izrel n’anya? [w01 10/1 p. 9 para. 7-9]
6. Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta okwu ndị ahụ Rehab ji ghọgbuo ndị eze dunyere ka ha gaa jide ndị nledo ahụ? (Jọsh. 2:4, 5) [w93 12/15 p. 25 para. 1]
7. Gịnị ka ihe e dere na Jọshụa 3:15, 16 banyere ụmụ Izrel na-akụziri anyị? [w04 12/1 p. 9 para. 6]
8. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Jọshụa ji lebara okwu ohi Ekan anya? (Jọsh. 7:20-25) [w04 12/1 p. 11 para. 4]
9. Olee otú ihe e kwuru na Jọshụa 9:22, 23 si egosi na Okwu Chineke ga-emezurịrị? [w04 12/1 p. 11 para. 3]
10. Olee otú ihe Keleb mere nwere ike isi gbaa anyị ume? (Jọsh. 14:8, 10-12) [w04 12/1 p. 12 para. 2; w93 5/15 p. 29 para. 1]