Akụkọ Ozi
Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na ndị nkwusa dị 292,373 nyere akụkọ ozi ha n’ọnwa July afọ a. Ọnụ ọgụgụ a ji ndị nkwusa 10,420 karịa nkezi nke afọ gara aga. Anyị na-ekele unu maka mgbalị unu mere ma na-emesi unu obi ike na “unu ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ unu.”−2 Ihe 15:7.