Akụkọ Ozi
Anyị ji akụkọ ozi ọnwa Ọgọst mechie afọ ije ozi gara aga, nke magburu onwe ya! Ndị nyere akụkọ ozi ha n’ọnwa ahụ dị 312,315. Nke ọnwa Ọgọst 2008 jitụ obere ihe karịa ya. Nkezi ndị nkwusa e nwere n’afọ ije ozi 2009 ji 9,226 karịa nkezi nke afọ ije ozi 2008. N’afọ ije ozi 2009, anyị nwere ndị ọsụ ụzọ oge niile dị 30,194, ọ bụkwa ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kacha elu. Anyị duziri ọmụmụ Baịbụl dị 628,458, nke bụ́kwa ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kacha elu na Naịjirịa. N’ihi otú Jehova si gọzie ọrụ anyị, anyị nwere ike ikwu ihe ahụ e dere n’Abụ Ọma 65:11, ya bụ, “I jiriwo ịdị mma gị kpuwe afọ okpueze.”