Akụkọ Ozi
N’ọnwa Julaị ruo Nọvemba nke afọ 2009, ndị nkwusa dị 689, bụ́ ndị si n’ọgbakọ 73 na Naịjirịa, jere ozi n’ókèala ndị a na-enweghị ọgbakọ. Ha ji awa 51,398 chọọ ndị yiri atụrụ. Ụmụnna ndị jere ozi n’otu obodo a na-akpọ Ndị Ọgbaga, nke dị n’Ebọnyị Steeti, kwuru, sị: “Otu nwoke bịara ọmụmụ ihe anyị ma kwuo na ya achọtala eziokwu ahụ ya na-achọ kemgbe ụwa. Ọ bịara ọmụmụ ihe niile anyị nwere ebe ahụ tupu anyị alaa.” Ì nwere ike ịhazi ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike soro gaa ozi n’ókèala a na-enweghị ọgbakọ n’afọ a?