Akụkọ Ozi
Mgbe a kpọrọ òkù ka ụmụnna gaa ozi n’ókèala na-enweghị ọgbakọ e kenyere ya, ndị nkwusa si n’otu ọgbakọ dị na Legọs gara obodo Ala na Idowa bụ́ obodo ndị dị n’Ogun Steeti. E nwere ọtụtụ ihe ọma ozi ahụ ha gara rụpụtara. Dị ka ihe atụ, ha hụrụ otu nwaanyị ọrịa strok kụrụ ngwọrọ. Mgbe ha gụụrụ ya nkwa Chineke kwere na Baịbụl na ndị ngwọrọ ga-emecha gaa ije, ọ sịrị: ‘Kemgbe m nwere nsogbu a, e nwetụbeghị ihe kasiri m obi ka ihe a unu gụụrụ m. Obi siri m ike na Chineke ga-emezu nkwa a. Ma, unu achọwala ịla, e nweghịkwa ebe ndị òtù unu na-anọ amụ ihe ebe a, ònye ga na-abịa akụziri m ihe? Ònye ga na-abịa akasi m obi? Biko unu alakwala, unu ahapụkwala m.’ Ì nwere ike ịhazi ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike soro gaa nyere ndị dị otú ahụ aka?