Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/11 p. 1
  • Ọrụ Kacha Enye Ọṅụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Kacha Enye Ọṅụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Nwere Ike Inye Aka n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Abụọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ka Ọrụ Ime Ndị Na-eso Ụzọ Na-enye Gị Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Akụkụ nke 1: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
    Ozi Alaeze Anyi—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2011
km 1/11 p. 1

Ọrụ Kacha Enye Ọṅụ

1. Olee ọrịa ime mmụọ a na-agwọ ndị mmadụ taa?

1 Ndị niile hụrụ mgbe a gwọrọ ndị mmadụ ọrịa na narị afọ mbụ ṅụrịrị nnukwu ọṅụ. (Luk 5:24-26) Taakwa, anyị na-aṅụrị ọṅụ ka a na-agwọ ndị mmadụ ọrịa ime mmụọ. (Mkpu. 22:1, 2, 17) Ọ na-atọ anyị ụtọ ịgụ otú Okwu Jehova na mmụọ nsọ ya si agbanwe ndụ ndị mmadụ. Ma, nke na-akadị enye obi ụtọ abụghị ịgụ akụkọ ndị a, kama ọ bụ mgbe anyị nwere ndị ọmụmụ Baịbụl anyị na ha na-enwe na-aga nke ọma.

2. Olee ihe nwere ike ime ka obi dị anyị ụtọ ka anyị na-akụziri mmadụ eziokwu?

2 Gịnị bụ aha Chineke? Gịnị mere o ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ? Gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ? Ọ bụ eziokwu na ọ na-atọ anyị ụtọ ịza ụdị ajụjụ ndị ahụ, ma obi na-adịkwa anyị ụtọ ma anyị hụ otú onye anyị na-amụrụ Baịbụl si enwe obi ụtọ n’ihi eziokwu ndị ọ na-amụta. (Ilu 15:23; Luk 24:32) Ka onye anyị na-amụrụ ihe na-aghọta ihe ndị ọ na-amụ, o nwere ike bido ịkpọ aha Jehova mgbe ọ bụla ọ na-ekwu banyere Chineke, na-ejikezi otú dị mma n’anya, kwụsị àgwà ọjọọ ndị ọ na-akpa, ma malite izi ndị ọzọ ozi ọma. Ọ bụrụ na o mechaa rara onwe ya nye Jehova ma mee baptizim, ọ ga-aghọ nwanna anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ. Nke ọ bụla o mere n’ime ihe ndị a na-eme ka anyị ṅụrịa.—1 Tesa. 2:19, 20.

3. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji bido ịmụrụ mmadụ Baịbụl?

3 Ị̀ Ga-esoli? Ọ bụrụ na ị ga-achọ iso n’ọrụ a kacha enye ọṅụ, rịọ Jehova ka o nyere gị aka inweta onye ị ga-amụwara Baịbụl, gbalịzie ka ị chọta onye ị ga na-amụrụ ihe. (1 Jọn 5:14) Gaa ozi ọma n’ebe a na-ahụkarị ndị mmadụ nakwa n’oge e nwere ike ịhụ ha. Mgbe ọ bụla o kwere mee, gwa ndị mmadụ na ị ga-achọ ka gị na ha bido ịmụ Baịbụl. (Ekli. 11:6) Ị chọta onye nwere mmasị ma kụọ mkpụrụ nke eziokwu ahụ n’obi ya, gaghachi gbaa ya mmiri.—1 Kọr. 3:6-9.

4. Gịnị mere ịgwa ndị mmadụ ka anyị na ha mụwa Baịbụl kwesịrị iji na-enu anyị enu n’obi?

4 A ka nwere ọtụtụ ndị agụụ ezi omume na-agụ, ndị akpịrị ezi omume na-akpọkwa nkụ. Ònye ga-amụwara ha Baịbụl ma si otú ahụ nyere ha aka igbo mkpa ime mmụọ ha? (Mat. 5:3, 6) Ka anyị wepụta onwe anyị soro rụchaa ọrụ ikwusa ozi ọma a na ọrụ inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs tupu oge e ji ewe ihe ubi agwụ.—Aịza. 6:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya