Akụkọ Ozi
N’ọnwa Jenụwarị 2011, ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ e nwere na Naịjirịa ruru 31,497. Nke a bụ ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kachanụ anyị nwetụrụla. N’ọnwa ahụkwa, magazin anyị nyere ndị mmadụ dị 2,005,610. Nke a bụ nke mbụ ya anyị na-enye ndị mmadụ magazin ole ahụ n’otu ọnwa. Akụkọ ozi a kwesịrị ime ka anyị na-agbakwu mbọ n’ozi anyị na-ejere Jehova ‘n’ihi na anyị ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ anyị.’—2 Ihe 15:7.