Ihe Kacha Eme Ka Mmadụ Bụrụ Ezigbo Onye Nkụzi
1. Olee ihe kacha eme ka mmadụ bụrụ ezigbo onye nkụzi?
1 Gịnị kacha eme ka mmadụ bụrụ onye ma akụzi Baịbụl? Ọ̀ bụ ịgụ oké akwụkwọ, afọ ole onye ahụ kụzirila ihe, ka ọ̀ bụ ọgụgụ isi ya? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ịhụnanya. Baịbụl kwuru na ịhụnanya bụ mmezu nke Iwu Mozis, ọ bụ ya ka e ji ama ndị na-eso ụzọ Jizọs, ọ bụkwa àgwà kachanụ e ji mara Jehova. (Jọn 13:35; Gal. 5:14; 1 Jọn 4:8) Ezigbo onye nkụzi ga-enwerịrị ịhụnanya.
2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị hụ ndị mmadụ n’anya?
2 Hụ Ndị Mmadụ n’Anya: Onye Ozizi Ukwu, bụ́ Jizọs, hụrụ ndị mmadụ n’anya. Nke a mekwara ka ndị ọ na-akụziri ihe na-ege ya ntị. (Luk 5:12, 13; Jọn 13:1; 15:13) Ọ bụrụ na ihe gbasara ndị mmadụ na-emetụ anyị n’obi, anyị ga-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ezi ha ozi ọma. Na ndị mmadụ enweghị mmasị n’ozi anyị ma ọ bụkwanụ na ha na-akpagbu anyị ekwesịghị ime ka anyị ghara ịna-ezi ha ozi ọma. Anyị kwesịrị igosi ndị anyị na-ezi ozi ọma na anyị bu ha n’obi, gbalịakwa hụ na ihe anyị na-agwa ha bụ ihe ga-enyere ha aka imeri nsogbu ha. Anyị gaa ịmụrụ mmadụ ihe, o kwesịghị ịdị anyị ọkụ ọkụ n’ahụ́, anyị kwesịkwara iwepụta ezigbo oge kwadebe ihe anyị chọrọ ịmụrụ mmadụ.
3. Olee otú iji eziokwu dị na Baịbụl akpọrọ ihe ga-esi enyere anyị aka n’ozi anyị?
3 Jiri Eziokwu Dị na Baịbụl Kpọrọ Ihe: Jizọs ejighị eziokwu dị n’Okwu Chineke egwu egwu, kama, o weere ya ka akụ̀. (Mat. 13:52) Ọ bụrụ na anyị ji eziokwu anyị mụtara na Baịbụl kpọrọ ihe, ọ ga na-enu anyị enu n’obi ịgwa ya ndị ọzọ, otú anyị sikwa na-ekwu ya nwere ike ime ka ndị mmadụ na-ege anyị ntị. Ọ ga-emekwa ka anyị ghara ichegbuwe onwe anyị n’ihi ihe anyị na-amachaghị eme n’ozi ọma, kama nke ahụ, anyị ga-elekwasị anya n’ihe anyị chọrọ ịgwa ndị mmadụ. Anyị mewe otú ahụ, anyị agaghịzi na-atụ ụjọ ịga ozi ọma.
4. Olee otú anyị ga-esi amụta ịhụ ndị ọzọ n’anya?
4 Otú E Si Amụta Ịhụ Ndị Ọzọ n’Anya: Olee otú anyị ga-esi amụta ịhụ ndị ọzọ n’anya? Ọ bụrụ na anyị echemie echiche n’ụdị ịhụnanya Jehova na Ọkpara ya hụrụ ụmụ mmadụ, chetakwa na ndị bi n’ókèala anyị amaghị nke a na-akọ na Baịbụl, ọ ga-eme ka anyị hụ ndị mmadụ n’anya. (Mak 6:34; 1 Jọn 4:10, 11) Anyị ga-ejikwu Okwu Chineke kpọrọ ihe ma anyị na-amụchi ihe anya ma na-atụgharị uche n’ihe anyị na-amụ. Ịhụnanya so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya nakwa ka o nyere anyị aka ịhụ ndị ọzọ n’anya. (Luk 11:13; 1 Jọn 5:14) Ma ànyị gụrụ oké akwụkwọ ma ànyị anọteela aka n’ọgbakọ ma ụbụrụ anyị ọ̀ na-aghọ nkọ, anyị ga-ama akụzi Baịbụl ma anyị hụ ndị ọzọ n’anya.