Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/12 p. 1
  • Dịrị Akọ Mgbe Ị Nọ n’Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Dịrị Akọ Mgbe Ị Nọ n’Ozi Ọma
  • Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Dị Irè n’Ozi Gị
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Si Ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Na-akpa Àgwà Ọma n’Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2012
km 5/12 p. 1

Dịrị Akọ Mgbe Ị Nọ n’Ozi Ọma

1. Olee ihe mere o ji dị mma ka anyị dịrị akọ mgbe anyị nọ n’ozi ọma?

1 Ndị ohu Chineke na-aga ozi ọma “n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ.” Ha ‘dị ka atụrụ nọ n’etiti anụ ọhịa wolf.’ (Mat. 10:16; Fil. 2:15) E nwere ọgba aghara n’ebe dị iche iche. Ndị obi na-adịghị mma na-apụtakwa n’ìgwè na-emebisị ihe. A na-atọrọkwa ọtụtụ ndị mmadụ. Ihe ndị a na-egosi na anyị bi n’oge ndị ajọ mmadụ “na-ajọwanye njọ.” (2 Tim. 3:13) Olee otú Baịbụl ga-esi enyere anyị aka ‘ịdị akọ’ mgbe anyị nọ n’ozi ọma?—Mat. 10:16.

2. Olee ihe ndị ọ ga-abụ ha mewe ma anyị nọrọ ozi ọma, anyị ahapụ ebe ahụ gaa kwusawa ozi ọma ebe ọzọ?

2 Gosi na Ị Ma Ihe: Ilu 22:3 kwuru na onye maara ihe na-ezo onwe ya ma ọ hụ ọdachi. N’ihi ya, anya ruo gị ala. Ọgba aghara nwere ike ịmalite na mberede n’ebe ị gara ozi ọma. I nwere ike hụ ìgwè ndị uwe ojii ka ha na-agagharị ma ọ bụkwanụ hụ ebe ndị mmadụ gbakọtara. Mgbe ụfọdụ, onye ị nọ ozi ọma na nke ya nwere ike ịgwa gị na agwọ nọ n’akịrịka. Kama ichere ka ị matachaa ihe na-aganụ, chọrọ ụzọ ozugbo.—Ilu 17:14; Jọn 8:59; 1 Tesa. 4:11.

3. Olee otú Ekliziastis 4:9 ga-esi enyere anyị aka mgbe anyị nọ ozi ọma?

3 Agala Ozi Ọma Naanị Gị: Akwụkwọ Ekliziastis 4:9 kwuru, sị: “Abụọ dị mma karịa otu.” O nwere ike ịbụ na ọ dịla anya ị gawara ozi ọma naanị gị n’enweghị nsogbu. Ma, ì chere na ọ ka dị mma ime otú ahụ? N’ebe ụfọdụ, mmadụ ka nwere ike ịna-aga ozi ọma naanị ya. Ma n’ebe ndị ọzọ, ọ gaghị adị mma ka nwanna nwaanyị ma ọ bụ onye ka na-eto eto gawa ozi ọma sọọsọ ya, nke ka nke ná mgbede. Ọ ka mma ka anyị na mmadụ soro. (Ekli. 4:10, 12) Gbalịa ka ị mara ebe ndị gị na ha so gaa ozi ọma nọ. Tupu i si ebe unu nọ ozi ọma gaa ebe ọzọ, gwa ndị nke ọzọ ebe ị na-aga.

4. Olee ihe anyị ga-eme ka ọ dịrị ndị okenye mfe ilekọta ọgbakọ?

4 Ọ bụ ndị okenye ka Chineke nyere ọrụ ilekọta ọgbakọ ya. Ha ‘na-eche mkpụrụ obi anyị nche.’ (Hib. 13:17) Jehova ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị adịrị obi umeala ma na-akwado mkpebi ndị ha na-eme. (Maị. 6:8; 1 Kọr. 10:12) Ka anyị niile jisie ike na-ekwusa ozi ọma n’ókèala anyị ma dịrị akọ mgbe anyị nọ ozi ọma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya