Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Mee: Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ nwere mmasị, nye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Gbalịakwa malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ̀ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha anaghị eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ, gbaa mbọ nye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi, gbalịakwa jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ha achọghị ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, e nwere ike nye ha magazin ọ bụla merela ochie ma ọ bụkwanụ broshọ ọ bụla ga-amasị ha. Julaị na Ọgọst: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na otu n’ime broshọ ndị a ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl.
◼ Na Fraịdee, abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Mee 2012, a gaghị anabata ndị ọbịa na Betel. N’ihi ya, biko, abịakwala ileta Betel n’ụbọchị ahụ ma ọ bụkwanụ iburu akwụkwọ.