Otú A Ga-esizi Na-enwe Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ na Nzukọ Ije Ozi
Bido n’izu na-amalite Septemba 3, Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ ga na-ewezi nkeji iri atọ kama nkeji iri abụọ na ise ọ na-ewe ugbu a. Kwa izu, onye ga-eduzi ya ga-ekwu okwu mmeghe ga-ewe otu nkeji. Ọ ga-eji oge ahụ tụleghachi ihe a mụrụ n’izu gara aga. Nzukọ Ije Ozi ga na-ewekwa nkeji iri atọ, kama nkeji iri atọ na ise ọ na-ewe ugbu a. A gaghịzi na-enwe oge e wepụtara iche maka ịma ọkwa. Ọ bụrụ na ọgbakọ enwee ọkwa ọ bụla ha chọrọ ịma, onye mbụ ga-eme ihe omume ná Nzukọ Ije Ozi ga-ama ya. Ọ bụghị mgbe niile ka a ga na-amara ọgbakọ ụdị ọkwa a. Nwanna mbụ ga-eme ihe omume ná Nzukọ Ije Ozi ekwesịghịkwa ikwu ihe omume ndị ga-esochi nke ya. A gaghịkwa ama ọkwa gbasara ebe a ga-aga ozi ọma, ndị ga-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma ọ bụkwanụ ndị ziteere ọgbakọ ozi ekele. (km 10/08 p. 1, para. nke 4) Ọ bụrụ na e nwee ọkwa dị ogologo a ga-amara ọgbakọ, ọ ga-adị mma ka e buru ụzọ gwa ndị nwere ihe omume ná Nzukọ Ije Ozi ka ha hapụtụrụ onye ga-ama ọkwa ahụ nkeji ole na ole.