Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Disemba 31, 2012. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Olee otú e sirila mezuo amụma ahụ dị na Joel 2:1-10, 28, nke kwuru banyere otú ụmụ ahụhụ ga-esi awakpo obodo Kenan? [Nọv. 5, w07 10/1 p. 13 para. 1]
2. Ole ndị ka ihe e kwuru n’Emọs 8:11 mezuru n’isi? Oleekwa ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ebe ọ bụ na anyị na-eriju nri ime mmụọ afọ? [Nọv. 12, jd p. 61 para. 9]
3. Gịnị mere ndị Idọm ji dị mpako? Oleekwa ihe anyị na-agaghị echefu? (Obed. 3, 4) [Nọv. 19, w07 11/1 p. 14 para. 1]
4. Gịnị mere Jehova ji gbanwee obi ya banyere ọdachi o kwuru na ya ga-ewetara ndị Ninive? (Jona 3:8, 10) [Nọv. 19, w07 11/1 p. 14 para. 14]
5. Olee otú ije ije n’aha Chineke nwere ike isi mee ka mmekọrịta anyị na ya chikwuo anya? (Maị. 4:5) [Nọv. 26, jd p. 88 para. 12]
6. Olee otú ihe e kwuru na Nehọm 2:6-10 si mezuo? Oleekwa otú mmezu ya si eme ka obi sie anyị ike? [Dis. 3, w07 11/15 p. 9 para. 2; w88 6/1 p. 31 para. 9]
7. Gịnị ka ihe e kwuru na Hagaị 1:6 pụtara? Oleekwa ihe anyị mụtara na ya? [Dis. 10, w06 4/15 p. 22 para. 12-15]
8. Na Zekaraya 7:10, a gwara anyị ‘akpala nkata n’obi anyị ime ibe anyị ihe ọjọọ.’ Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe amaokwu a kwuru? [Dis. 17, jd p. 113 para. 6; w07 12/1 p. 11 para. 2]
9. Gịnị mere obi ga-eji dị ndị ohu Jehova mma taa ma ha cheta ihe e kwuru na Zekaraya 4:6, 7? [Dis. 17, w07 12/1 p. 10 para. 7]
10. N’ihi ihe e kwuru na Malakaị 3:16, gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma? [Dis. 31, w07 12/15 p. 29 para. 3]