Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Eprel 29, 2013. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Olee ihe dị mkpa Jizọs kwuru gbasara di na nwunye na Mak 10:6-9? [Mach 4, w08 2/15 p. 30 para. 8]
2. Gịnị ka iji mkpụrụ obi dum na-ejere Jehova ozi pụtara? (Mak 12:30) [Mach 4, w97 10/15 p. 13 para. 4]
3. Gịnị bụ “ihe ụfụ nke nhụjuanya” e kwuru okwu ya na Mak 13:8? [Mach 11, w08 3/15 p. 12 para. 2]
4. Olee ebe Luk si nweta ihe ndị o dere n’Oziọma ya? (Luk 1:3) [Mach 18, w09 3/15 p. 32 para. 4]
5. Olee ihe anyị kwesịrị ime ebe ọ bụ na Setan na-achọ oge “ga-adaba adaba” ọ ga-eji anwa anyị ọnwụnwa? (Luk 4:13) [Mach 25, w11 1/15 p. 23 para. 10]
6. Olee otú anyị ga-esi eme ihe ahụ e kwuru na Luk 6:27, 28? [Mach 25, w08 5/15 p. 8 para. 4]
7. Tupu e jiri Jizọs chụọ àjà mgbapụta, gịnị mere o ji gbaghara otu nwaanyị mmehie ya? (Luk 7:37, 48) [Epr. 1, w10 8/15 p. 6-7]
8. Olee ihe ụmụazụ Kraịst ‘ịkpọ ndị ikwu ha asị’ pụtara? (Luk 14:26) [Epr. 15, w08 3/15 p. 32 para. 1; w92 7/15 p. 9 para. 3-5]
9. Gịnị ka ndị mmadụ ga-eme ma ha hụ “ihe ịrịba ama dị iche iche n’anyanwụ na n’ọnwa nakwa na kpakpando?” (Luk 21:25) [Epr. 22, w97 4/1 p. 15 para. 8-9]
10. Mgbe anyị na-ekpe ekpere ma ọnwụnwa tara akpụ bịara anyị, olee otú anyị nwere ike isi mee ka Jizọs? (Luk 22:44) [Epr. 29, w07 8/1 p. 6 para. 2]