Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Jun 24, 2013. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Jizọs kwuru na Jọn 3:14, 15, sị: ‘Dị nnọọ ka Mozis weliri agwọ elu n’ala ịkpa, otú ahụ ka a na-aghaghị iweli Nwa nke mmadụ elu.’ Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? [Mee 6, gt isi 17 para. 5]
2. Olee mgbe ndị na-eso ụzọ Kraịst na-enweta ndụ n’ime onwe ha, ma ọ bụ ndụ zuru ezu? (Jọn 6:53) [Mee 13, w03 9/15 p. 31 para. 3]
3. Olee otú Jizọs si mee ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè mara Nna ya? Nye ihe atụ. (Jọn 8:28) [Mee 20, w11 4/1 p. 7 para. 3]
4. Jọn 11:35 kwuru na “anya mmiri gbara Jizọs” mgbe Lazarọs enyi ya nwụrụ. Gịnị ka ihe ahụ o mere na-akụziri anyị? [Mee 20, w08 5/1 p. 24 para. 3-5]
5. Olee ihe anyị na-amụta n’otú ahụ Jizọs si saa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya? (Jọn 13:4, 5) [Mee 27, w99 3/1 p. 31 para. 1]
6. Olee otú mmụọ Chineke ga-esi na-edu anyị nke ọma? (Jọn 14:26) [Mee 27, w11 12/15 p. 14-15 para. 9]
7. Na Jọn 21:15, Jizọs jụrụ Pita ma ọ̀ hụrụ ya n’anya karịa “ihe ndị a,” gịnị bụ “ihe ndị a” Jizọs kwuru okwu ya? Oleekwa ihe nke ahụ na-akụziri anyị? [Jun 3, w08 4/15 p. 32 para. 12]
8. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 2:44-47 nakwa n’Ọrụ Ndịozi 4:34, 35, olee ihe anyị niile kwesịrị ịna-eme? [Jun 10, w08 5/15 p. 30 para. 5]
9. Ihe ahụ Stivin kwuru n’Ọrụ Ndịozi 7:59 ọ̀ pụtara na ọ bụ Jizọs ka o kpegaara ekpere? [Jun 17, w08 5/15 p. 31 para. 2]
10. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Banabas? Oleekwa uru ọ ga-abara anyị? (Ọrụ 9:26, 27) [Jun 24, bt p. 65 para. 19]