Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Julaị
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị: “O nweghị onye ị ga-ajụ ma ọ̀ chọrọ ịdị ogologo ndụ, ya asị gị mba. Onye ọ bụla chọkwara ịna-enwe obi ụtọ. Ma, ì chere na sayensị na ọgwụ ndị a na-emepụta ga-emeli ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi? [Chere ka ọ zaa.] Ya kwuchaa, gị egosi ya, Ụlọ Nche Julaị 1, peeji nke 16. Gị na ya tụlee ihe e kwuru n’ajụjụ nke mbụ dị na peeji ahụ, gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị n’ebe ahụ. I mechaa, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ihe ị ga-eburu n’obi: A ga-eme ihe ngosi a mgbe a na-enwe nzukọ ozi ubi na Julaị 6.
Ụlọ Nche Julaị 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị: “Ọtụtụ ndị na-agwa anyị na ha nwere okpukpe ha na-ekpe. O nwekwara ndị nke na-asị na ike okpukpe agwụla ha. Gịnwa kwanụ? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị ya:] Jizọs kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịma okpukpe nke bụ́ ezigbo ya. [Gụọ Luk 6:44a. Kwuzie, sị:] Ụlọ Nche a kwuru gbasara ihe ọjọọ ụfọdụ okpukpe na-eme. Ọ zakwara ajụjụ bụ́, ‘È Nwere Okpukpe nke Bụ́ Ezigbo Okpukpe?’”
Teta! Julaị–Ọgọst
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị: “Ndị omekome juru ebe niile taa, ha anaghịkwa ekwe anyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ụfọdụ na-eche na ndị omekome agaghị na-akpacha ike ha na-akpa ugbu a ma e nwee ọtụtụ ndị uwe ọjii. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị ya:] Ị̀ ma na Chineke kwere nkwa na a ga-enwe oge ndị omekome na-agaghị adị n’ụwa a? [Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11.] Teta! a kọwara otú Chineke ga-esi eme ya, kwuokwa ihe ndị anyị nwere ike ime ka ndị omekome ghara inweta anyị.”
Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị: “O nwere ihe dị mkpa si na Baịbụl anyị na ezinụlọ dị iche iche na-ekwurịta taa. Ọ̀ kwa ị ma na Chineke hụrụ anyị n’anya? Ma, ọtụtụ n’ime ndị anyị na ha kwurula okwu taa amaghị ihe mere Chineke onye hụrụ anyị n’anya ji kwere ka anyị na-ata ahụhụ. Olee ihe gịnwa chere? Ì chere na Chineke kere anyị ka anyị na-ata ahụhụ?” Chere ka ọ zaa. Sapetezie isi nke 5, gị na ya tụlee paragraf nke mbụ na nke abụọ. Gụọkwanụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ e dere “gụọ.” Unu mechaa, nye ya broshọ ahụ. Gị na ya yie mgbe ọzọ ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.