Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Ọktoba: Ụlọ Nche na Teta! Nọvemba na Disemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?, ma ọ bụ traktị ọ bụla unu nwere. Jenụwarị: Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! ma ọ bụ broshọ ọ bụla unu nwere.
◼ Otu izu tupu ọgbakọ unu agaa mgbakọ distrikti, unu nwere ike wepụta nkeji ole na ole n’ihe omume Nzukọ Ije Ozi, jiri ya tụlee ihe ndị e kwesịrị iburu n’uche gbasara mgbakọ ahụ unu ga-aga nke dị n’Ozi Alaeze Ọgọst. Otu ọnwa ma ọ bụ ọnwa abụọ unu lọtara mgbakọ, unu nwere ike iji oge e kwesịrị iji tụlee mkpa ọgbakọ tụlee ihe ụfọdụ e kwuru ná mgbakọ ahụ, bụ́ ndị ga-abara ụmụnna uru n’ozi ọma.