Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Disemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?, ma ọ bụ traktị ọ bụla unu nwere. Jenụwarị: Anyị ga-enye ndị mmadụ Akụkọ Alaeze nke 38, nke isiokwu ya bụ “Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?” Ọ bụrụ na ndị nke dị n’ọgbakọ unu agwụla tupu ọnwa Jenụwarị agwụ, unu nwere ike nyewe ndị mmadụ broshọ ndị a ga-enye ha n’ọnwa Febụwarị. Febụwarị: Ozi Ọma Si n’aka Chineke!, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi, Gee Chineke Ntị, Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? ma ọ bụ broshọ ọzọ unu nwere n’ọgbakọ unu. I nwere ike inye ndị Alakụba broshọ bụ́ Real Faith—Your Key to a Happy Life ma ọ bụ The Guidance of God—Our Way to Paradise. I nwekwara ike inye mmadụ ha abụọ. Mach: Ụlọ Nche na Teta!
◼ A ga-echeta Ọnwụ Jizọs n’abalị atọ n’ọnwa Eprel 2015.