Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Jenụwarị: Anyị ga-enye ndị mmadụ Akụkọ Alaeze nke 38, nke isiokwu ya bụ Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ? Ọ bụrụ na ndị nke dị n’ọgbakọ unu agwụla tupu ọnwa Jenụwarị agwụ, unu nwere ike nyewe ndị mmadụ broshọ ndị a ga-enye ha n’ọnwa Febụwarị. Febụwarị: Ozi Ọma Si n’aka Chineke!, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi, Gee Chineke Ntị, Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? ma ọ bụ broshọ ọzọ unu nwere n’ọgbakọ unu. I nwere ike inye ndị Alakụba broshọ bụ́ Real Faith—Your Key to a Happy Life ma ọ bụ The Guidance of God—Our Way to Paradise. I nwekwara ike inye mmadụ ha abụọ. Mach na Eprel: Ụlọ Nche na Teta!
◼ Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na n’afọ 2014, a ga-enwe mgbakọ sekit na mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ ndị ogbi (ASL) n’ebe ndị a: Na Badagrị, ọ ga-abụ na Mach 15-16 nakwa na Julaị 6. Na Bini Siti, ọ ga-abụ na Febụwarị 15 nakwa na Mee 3-4. N’Ịbadan, ọ ga-abụ na Jun 14-15 nakwa n’Ọgọst 23. Na Kwali, ọ ga-abụ na Mee 24-25 nakwa n’Ọgọst 9. Na Leki, ọ ga-abụ na Mach 1-2 nakwa na Julaị 13. N’Uli, ọ ga-abụ na Febụwarị 23 nakwa na Mee 10-11. A ga-enwekwa mgbakọ sekit na mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ French. A ga-enwe ha na Leki n’Eprel 5-6 nakwa na Julaị 19. Ná ndị nke a ga-enwe n’asụsụ ndị ogbi, okwu niile a ga-ekwu ga-abụ n’asụsụ ndị ogbi. Na nke ahụ a ga-enwe n’asụsụ French, okwu niile ga-abụkwa n’asụsụ French. Ọ bụrụ na ị na-aghọta asụsụ ndị a, gbalịa gaa mgbakọ ndị ahụ.