Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Ọgọst: Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!, Gee Chineke Ntị, ma ọ bụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Septemba na Ọktoba: Ụlọ Nche na Teta! Nọvemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ma ọ bụ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?
◼ Ọ fọ otu izu tupu unu agawa mgbakọ ukwu, e kwesịrị ịhazigharị ihe omume unu ga-enwe ná Nzukọ Ije Ozi ka unu nwee ike ịtụle ihe ụfọdụ e kwuru n’Ozi Alaeze a gbasara mgbakọ ukwu nakwa akwụkwọ ozi e detaara ọgbakọ niile nke Ọgọst 3, 2013, gbasara ihe anyị ga-eme ka anyị ghara imerụ ahụ́ ma anyị gaa mgbakọ. Otu ọnwa ma ọ bụ ọnwa abụọ unu lọtara mgbakọ, e nwere ike iji oge e ji atụle mkpa ọgbakọ tụlee ihe ụfọdụ ụmụnna mụtara ná mgbakọ ukwu nke ga-enyere ha aka n’ozi ọma.