Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọktoba 27, 2014.
1. Ọnụ Ọgụgụ isi iri abụọ na otu amaokwu ise kwuru na ụmụ Izrel kwuru okwu megide Chineke na Mozis. Gịnị mere ha ji mee mkpesa ahụ? Gịnịkwa ka anyị mụtara na ya? [Sep. 1, w99 8/15 p. 26-27]
2. Gịnị mere Jehova ji weso Belam iwe? (Ọnụ Ọgụ. 22:20-22) [Sep. 8, w04 8/1 p. 27 para. 2]
3. Olee ụdị onye Ọnụ Ọgụgụ 25:11 mere ka anyị mara na Finihas bụ? Oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ya? [Sep. 8, w04 8/1 p. 27 para. 4]
4. Olee ihe gosiri na Mozis dị umeala n’obi? Oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ya? (Ọnụ Ọgụ. 27:5, 15-18) [Sep. 15, w13 2/1 p. 5]
5. Olee otú Jọshụa na Keleb si gosi na ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike ime ihe Chineke chọrọ n’agbanyeghị na a na-emegide ha? (Ọnụ Ọgụ. 32:12) [Sep. 22, w93 11/15 p. 14 para. 13]
6. Olee otú otú ụmụ Zelofehad si rubere Jehova isi ga-esi nyere nwanna na-achọ onye ọ ga-alụ aka? (Ọnụ Ọgụ. 36:10-12) [Sep. 29, w08 2/15 p. 4-5 para. 10]
7. Gịnị ka Jehova mere ụmụ Izrel maka iwe ha wesara ya? Gịnịkwa ka anyị mụtara n’ihe ahụ mere ha? (Diut. 1:26-28, 34, 35) [Ọkt. 6, w13 8/15 p. 11 para. 7]
8. Ọ bụrụ na ụmụ Izrel chọrọ ka Jehova gọzie ha, ihe agakwaara ha nke ọma n’Ala Nkwa ahụ, olee ihe abụọ ha kwesịrị ime? (Diut. 4:9) [Ọkt. 13, w06 6/1 p. 29 para. 15]
9. Olee otú o si bụrụ na ákwà ụmụ Izrel akaghị nká, ụkwụ ha azaghịkwa aza mgbe ha nọ na-agagharị n’ala ịkpa? (Diut. 8:3, 4) [Ọkt. 20, w04 9/15 p. 25 para. 9]
10. A gwara ụmụ Izrel na ha kwesịrị ịrapara Jehova n’ahụ́. Olee otú anyị ga-esi rapara Jehova n’ahụ́ taa? (Diut. 13:4, 6-9) [Ọkt. 27, w02 10/15 p. 16 para. 14]