Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Eprel 27, 2015. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
Olee ihe ịhụnanya na-adịgide adịgide ga-eme ka anyị ghara ime? Oleekwa ndị kwesịrị inwe ụdị ịhụnanya a? (Rut 1:16, 17) [Mach 2, w12 7/1 p. 26 para. 5]
Olee otú Rut si gosi na ya bụ “ezigbo nwaanyị”? (Rut 3:11) [Mach 2, w12 10/1 p. 23 para. 1]
Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, olee otú ihe Baịbụl kọrọ gbasara Hana nwere ike isi nyere anyị aka? (1 Sam. 1:16-18) [Mach 9, w07 3/15 p. 16 para. 4-5]
Mgbe Samuel bụ nwatakịrị “na-eto n’ebe Jehova nọ,” gịnị mere na ọ mụtaghị àgwà ọjọọ ụmụ Ilaị na-akpa? (1 Sam. 2:21) [Mach 9, w10 10/1 p. 16 para. 3-4]]
Mgbe “ndị ikom na-abaghị n’ihe” katọrọ Sọl, o mesighị ha ike. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe a? (1 Sam. 10:22, 27) [Mach 23, w05 3/15 p. 23 para. 1]
Sọl chere na ọ bụrụgodị na ya enupụrụ Jehova isi na ya nwere ike ịchụrụ ya àjà iji mee ka obi jụrụ ya. Gịnị ka ihe a o chere na-akụziri anyị? (1 Sam. 15:22, 23) [Mach 30, w07 6/15 p. 26 para. 3-4]
Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike ma anyị cheta na Chineke “na-ahụ ihe dị n’obi” mmadụ? (1 Sam. 16:7) [Epr. 6, w10 3/1 p. 23 para. 7]
Dị ka e kwuru n’Ilu 1:4, olee ihe Jehova na-atụ anya ka anyị jiri kpebie ihe anyị ga-eme ma nsogbu tara akpụ bịara anyị? (1 Sam. 21:12, 13) [Epr. 13, w05 3/15 p. 24 para. 5]
Olee ihe mere e nwere ike iji kwuo na Abigel enupụrụghị di ya isi mgbe o nyere Devid na ndị ohu ya nri? (1 Sam. 25:10, 11, 18, 19) [Epr. 20, w09 7/1 p. 20 para. 4]
Abigel rịọrọ mgbaghara maka ihe ọ na-emeghị. Olee ihe anyị mụtara n’ihe ahụ o mere? (1 Sam. 25:24) [Epr. 20, w02 11/1 p. 5 para. 1, 4]