Ọktoba 16-22
HOSIA 1-7
Abụ nke 18 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Jehova Bụ Chineke Na-ahụ n’Anya, Olee Maka Gịnwa?”: (Nkeji 10)
[Kpọnye vidio Ihe Akwụkwọ Hosia Na-ekwu.]
Hos. 6:4, 5—Obi adịghị Jehova ụtọ maka enweghị ịhụnanya ndị Izrel (w10 8/15 25 ¶18)
Hos. 6:6—Jehova na-enwe obi ụtọ ma anyị na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya (w07 9/15 16 ¶8; w07 6/15 27 ¶7)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Hos. 1:7—Olee mgbe e gosiri Juda obi ebere ma zọpụta ya? (w07 9/15 14 ¶7)
Hos. 2:18—Olee otú amaokwu a si mezuo n’oge gara aga, oleekwa otú ọ ga-esi emezu n’ọdịnihu? (w05 11/15 20 ¶16; g05-E 9/8 12 ¶2)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Hos. 7:1-16
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) 1 Jọn 5:3— Na-akụzi Eziokwu. Gwa onye ahụ ka ọ bịa ọmụmụ ihe.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Diut. 30:11-14; Aịza. 48:17, 18—Na-akụzi Eziokwu. Gwa onye ahụ ka ọ gaa na jw.org/ig. (Gụọ mwb16.08 8 ¶2.)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) lv 12-13 ¶16-18—Gosi otú anyị ga-esi ruo onye anyị na-amụrụ ihe n’obi.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mkpa Ọgbakọ: (Nkeji 15) Okwu okenye ga-ekwu. Jiri nkeji ise kwuo okwu mmeghe si na Baịbụl. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Nọvemba 15, 2015, peeji nke 14. Kpọnyezie vidio bụ́ Otú E Si Esi na Kọmputa ma Ọ Bụ n’Ekwentị Enye Onyinye. E lechaa vidio ahụ, gosi ụmụnna isiokwu bụ́ “Otú E Si Enye Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ” na jw.org. Gwa ha ụzọ dị iche iche e nwere ike isi jiri kọmputa ma ọ bụ ekwentị nye onyinye n’obodo unu.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr isi nke 20 ¶1-6, na igbe ndị dị na peeji nke 211 na 214
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 50 na Ekpere