Nọvemba 27–Disemba 3
NEHỌM 1–HABAKỌK 3
Abụ nke 154 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Mụrụ Anya ma Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ofufe Jehova”: (Nkeji 10)
[Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Nehọm Na-ekwu.]
[Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Habakọk Na-ekwu.]
Hab. 2:1-4—Iji bụrụ ndị a ga-azọpụta n’ụbọchị ikpe Jehova na-abịanụ, anyị kwesịrị ‘ịna-atụ anya ya’ (w07 11/15 10 ¶3-5)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Nehọ. 1:8; 2:6—Olee otú e si bibie Ninive? (w07 11/15 9 ¶2)
Hab. 3:17-19—N’agbanyeghị na ihe nwere ike ịtara anyị akpụ tupu Amagedọn nakwa n’Amagedọn, olee ihe nwere ike ime ka anyị nwee obi ike? (w07 11/15 10 ¶10)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Hab. 2:15–3:6
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Ozi Ụlọ n’Ụlọ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) hf—Gwa onye ahụ ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ.
Nletaghachi: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) hf—Gosi otú a ga-esi agaghachi na nke onye ahụ natara broshọ n’ozi ụlọ n’ụlọ.
Okwu: (Nkeji 6 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) w16.03 3-5—Isiokwu: Ì Nwere Ike Inye Aka n’Ọgbakọ Unu?
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Mụrụ Anya ma Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ofufe Jehova n’Oge Ihe Gbanweere Gị”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio aha ya bụ Otú Okwukwe Anyị Ga-esi Bụrụ A Kwaa Akwụrụ Ma Anyị Kwagawa Ebe Ọzọ.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr isi nke 22 ¶1-7
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3). Gwa ụmụnna na akwụkwọ a ga-enye n’ọnwa Disemba bụ Teta! isiokwu ya bụ “Mmebi Ụwa Ò Ruwela?” A ga-etinye vidio otú anyị ga-esi ezi ozi ọma a ga-ele n’izu ọzọ na JW Library na Nọvemba 30. Ndị nkwusa kwesiri ịgbalị hụ na e kesara Teta! a ka o ruo mmadụ niile aka.
Abụ nke 129 na Ekpere