Julaị 1-7
NDỊ KỌLỌSI 1-4
Abụ nke 56 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Yipụnụ Mmadụ Ochie Ahụ ma Yirinụ Mmadụ Ọhụrụ Ahụ”: (Nkeji 10)
[Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Ndị Kọlọsi Na-ekwu.]
Kọl. 3:5-9—“Yipụnụ mmadụ ochie ahụ” (w11 3/15 10 ¶12-13)
Kọl. 3:10-14—“Yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ” (w13 9/15 21 ¶18-19)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Kọl. 1:13, 14—Gịnị bụ “alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya ya”? (it-2 169 ¶3-5)
Kọl. 2:8—Gịnị bụ “ihe ndị mbụ nke ụwa”? (w08 8/15 28 ¶8)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Kọl. 1:1-20 (th ihe ọmụmụ nke 2)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe: (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Kụzie Ihe Bụ́ Eziokwu Otú Ga-eme Ka Ndị Ị Na-agwa Okwu Kweta Ya, tụleekwanụ ihe ọmụmụ nke 7 na broshọ Izi Ihe.
Okwu: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) w04 5/1 19-20 ¶3-7—Isiokwu: Olee Otú Ụfọdụ Ndị Kraịst Si Bụụrụ Pọl ‘Ndị Enyemaka Na-eme Ka A Dị Ike’? (Kọl. 4:11) (th ihe ọmụmụ nke 7)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Akụkọ Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi nke Afọ 2018: (Nkeji 15) Kpọnye vidio ahụ. Tụleekwanụ ajụjụ ndị a: Kemgbe ụwa, olee otú ime njem si dị mkpa ná nzukọ Jehova? Olee otú ngalaba na-ahụ maka ime njem n’isi ụlọ ọrụ anyị si ahụ na e mefusịghị ego anyị aghara aghara? Olee ihe ndị nkwusa nwere ike ime iji belata ego nzukọ Jehova na-emefu n’ime njem? Olee otú ngalaba na-ahụ maka ime njem n’isi ụlọ ọrụ anyị si na-enyere ndị ga-esi mba dị iche iche gaa mgbakọ mba niile nke afọ 2019 aka?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 73
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 102 na Ekpere