OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Na-adị Umeala n’Obi—Etokwala Onwe Gị
Onye na-eto onwe ya ma na-etu ọnụ na-egosi na ọ dị mpako. O nweghịkwa uru ụdị omume a na-abara ndị ọzọ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ka onye bịara abịa too gị, ọ bụghị ọnụ gị.”—Ilu 27:2.
LEENỤ VIDIO BỤ́ BỤRỤ ENYI JEHOVA—NA-ADỊ UMEALA N’OBI, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ejikarị etu ọnụ?
Olee ihe Kelechi ji na-etu ọnụ mgbe ya na ndị enyi ya nọ?
Olee otú papa Kelechi si nyere ya aka?
Olee otú 1 Pita 5:5 nwere ike isi nyere anyị aka ịdị umeala n’obi?