Septemba 14-20
ỌPỤPỤ 25-26
Abụ nke 18 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ihe Kacha Mkpa n’Ụlọikwuu Ahụ”: (Nkeji 10)
Ọpụ. 25:9—Jehova kwuru otú a ga-esi arụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ (it-1 165)
Ọpụ. 25:21—Ọ bụ n’ime igbe ahụ ka e tinyere ihe àmà ahụ dị nsọ (it-1 166 ¶2)
Ọpụ. 25:22—Igbe ahụ bụ ihe na-egosi na Chineke nọ n’ụlọikwuu ahụ (it-1 166 ¶3)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Ọpụ. 25:20—Gịnị ka ọ ga-abụ ya ka otú e si kpụnye ndị cherọb ahụ n’elu ihe mkpuchi igbe ahụ na-egosi? (it-1 432 ¶1)
Ọpụ. 25:30—Gịnị bụ achịcha ahụ a na-eche n’ihu Jehova? (it-2 936)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọpụ. 25:23-40 (th ihe ọmụmụ nke 5)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Nletaghachi: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ ma jụọ ajụjụ ndị a: Olee otú onye nkwusa ahụ si jiri mmetụta kwuo okwu? Olee otú ọzọ onye nkwusa ahụ nwere ike isi gwa onye nwe ụlọ gbasara otu n’ime ihe ndị dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe?
Nletaghachi: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Mee ihe dị na peeji nke mbụ. (th ihe ọmụmụ nke 8)
Nletaghachi: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Nyezie ya otu n’ime ihe ndị dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. (th ihe ọmụmụ nke 11)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ihe Nzukọ Jehova Na-eme: (Nkeji 5) Kpọnye vidio Ihe Nzukọ Jehova Na-eme nke ọnwa Septemba.
Mkpa Ọgbakọ: (Nkeji 10)
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) jy isi nke 132 na igbe isiokwu ya bụ “Kpọgide Ya n’Osisi”
Okwu Mmechi (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Abụ nke 20 na Ekpere