Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Jenụwarị p. 8-9
  • Jenụwarị 29–Febụwarị 4

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jenụwarị 29–Febụwarị 4
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Jenụwarị p. 8-9

JENỤWARỊ 29–FEBỤWARỊ 4

JOB 40-42

Abụ nke 124 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ihe Anyị Na-amụta n’Ihe Mere Job

(Nkeji 10)

Cheta na ị marughị ihe ka Jehova (Job 42:1-3; w10 10/15 3-4 ¶4-6)

Dịrị njikere ịnabata ndụmọdụ Jehova na nzukọ ya na-enye gị (Job 42:5, 6; w17.06 25 ¶12)

Jehova na-agọzi ndị jidesiri ya aka ike n’agbanyeghị nsogbu (Job 42:10-12; Jems 5:11; w22.06 25 ¶17-18)

Ebe Job na nwunye ya nọ n’akụkụ ugwu na-ele ibe ha anya, obi dịkwa ha ụtọ maka otú Jehova si gọzie ha. Job na-atụ ìgwè ewu na atụrụ ha na ụlọ ha aka.

Jehova gọziri Job maka na o jisiri ya aka ike

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Job 42:7​—Ònye n’eziokwu ka ndị enyi atọ Job nọ na-ekwujọ, oleekwa otú ịmara ihe a ga-esi enyere anyị aka idi mkparị? (it-2 808)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Job 42:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 11)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye nwe ụlọ abụghị onye chọọchị. (lmd isi nke 5 nọmba nke 3)

5. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 5) lff isi nke 13 nọmba nke 6-7 na Ụfọdụ Na-asị (lmd isi nke 11 nọmba nke 4)

6. Okwu

(Nkeji 4) lmd ihe ndị ọzọ a kọwara nke A nọmba nke 2​—Isiokwu: O Nweghị Ihe Ga-eme Ka E Bibie Ụwa A. (th ihe ọmụmụ nke 13)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 108

7. Nyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Mata na Jehova Hụrụ Ha n’Anya

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Foto si na vidio bụ́ “Anyị Nwetara Ezinụlọ Hụrụ Anyị n’Anya nke Na-efe Jehova.” Mimi na mama ya na-ewetara nwanna nwaanyị nọ n’ụlọ ọgwụ okooko osisi na kaadị.

Obi dị anyị ụtọ na anyị na-efe Chineke onye bụ́ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8, 16) Ọmarịcha àgwà ndị Jehova nwere na-adọta anyị n’ebe ọ nọ, na-emekwa ka anyị na ya bụrụ nnu na mmanụ. Ebe anyị bụ atụrụ Jehova, anyị ma na ọ hụrụ anyị n’anya.

Anyị kwesịrị isi n’otú anyị si emeso ndị ezinụlọ anyị, ndị anyị na ha na-efe Jehova, na ndị ọzọ gosi ha ụdị ịhụnanya Jehova na-egosi anyị. (Job 6:14; 1 Jọn 4:11) Ọ bụrụ na anyị na-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, anyị na-enyere ha aka ịmata onye Jehova bụ na ịbịaru ya nso. Ma, ọ bụrụ na anyị egosighị ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, o nwere ike isiri ha ike ikweta na Jehova hụrụ ha n’anya.

Kpọnye VIDIO bụ́ Anyị Nwetara Ezinụlọ Hụrụ Anyị n’Anya nke Na-efe Jehova. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Lei Lei na Mimi gbasara otú igosi ndị ọzọ ịhụnanya dịruru ná mkpa?

Gịnị ka anyị ga-eme iji nyere ụmụnna anyị aka ka ha mata na Jehova hụrụ ha n’anya?

  • Were ha ka atụrụ Jehova hụrụ n’anya.​—Ọma 100:3

  • Na-agwa ha okwu otú ga na-agba ha ume.​—Efe. 4:29

  • Na-emeso ha ihe otú gosiri na ihe banyere ha na-emetụ gị n’obi. ​—Mat. 7:11, 12

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 5 ¶9-16

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 126 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya