Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb24 Jenụwarị p. 12-13
  • Febụwarị 19-25

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Febụwarị 19-25
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2024
mwb24 Jenụwarị p. 12-13

FEBỤWARỊ 19-25

ABỤ ỌMA 8-10

Abụ nke 2 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. ‘Jehova, M Ga-eto Gị’

(Nkeji 10)

Ihe ọma ndị Jehova na-emere anyị enweghị atụ (Ọma 8:3-6; w21.08 3 ¶6)

Obi na-adị anyị ụtọ ito Jehova. Otu ụzọ anyị si eme ya bụ ịkọrọ ndị ọzọ banyere ọrụ ndị dị ebube ọ na-arụ (Ọma 9:1; w20.05 23 ¶10)

Anyị na-etokwa ya mgbe anyị ji obi anyị niile na-abụku ya abụ (Ọma 9:2; w22.04 7 ¶13)

Foto ndị na-egosi: Ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi na-eto Jehova. 1. Ebe nwanna nwaanyị merela agadi na-ezi onye na-elekọta ndị ọrịa ozi ọma. 2. Ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe. 3. Ebe nwata nwoke na-eweli aka ka ọ zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe. 4 Ebe nwanna nwoke na-eto eto so na-ehicha Ụlọ Nzukọ Alaeze. 5. Ebe nwanna nwaanyị na-eto eto na-ezi nwa klas ya ozi ọma.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ụzọ ndị ọzọ m nwere ike isi too Jehova?’

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ọma 8:3, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.​—Mgbe ọbụ abụ ahụ kwuru “mkpịsị aka” Chineke, gịnị ka o bu n’obi? (it-1 832)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ọma 10:1-18 (th ihe ọmụmụ nke 11)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Onye nwe ụlọ gwara gị na ya ekweghị na Chineke. (lmd isi nke 5 nọmba nke 4)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. N’oge mbụ gị na ya kparịtara, ọ gwara gị na ya ekweghị na Chineke dị, ma ọ dị njikere ileba anya n’ihe ndị gosiri na e nwere Onye kere ihe niile. (th ihe ọmụmụ nke 7)

6. Okwu

(Nkeji 5) w21.06 6-7 ¶15-18​—Isiokwu: Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka Ha Too Jehova. (th ihe ọmụmụ nke 10)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 10

7. Otú Ị Ga-esi Gbaara Mmadụ Àmà Ma Gị na Ya Kparịtawa Ụka n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi

(Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Otu ụzọ anyị ga-esi na-etokwu Jehova bụ ịna-ezi ndị anyị na ha na-ahụ kwa ụbọchị ozi ọma. (Ọma 35:28) Ná mmalite, izi ndị mmadụ ozi ọma n’oge anyị na-anọghị n’ozi nwere ike ịna-atụ anyị ụjọ. Ma, anyị mụta otú anyị ga-esi ebido ịkpanyere ndị mmadụ ụka na ihe anyị ga-eme ka anyị na ha kpara ụka na-aga, anyị ga-abụ aka ochie na ya, ya atọwazie anyị ụtọ.

Foto si na vidio bụ́ “Jikere Izi ‘Ozi Ọma nke Udo’​—Malite Ịkpanyere Ha Ụka.” Ebe nwanna nwaanyị na-akpanyere otu nwaanyị nọ nso na tebụl ya n’ụlọ oriri ụka.

Kpọnye VIDIO bụ́ Jikere Izi “Ozi Ọma nke Udo”​—Malite Ịkpanyere Ha Ụka. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

Gịnị ka ị mụtara n’ihe ngosi a nke ga-enyere gị aka imekwu nke ọma n’ịgba àmà n’oge ị na-anọghị n’ozi?

Lekwa ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka ịmalite ịkpanyere ndị mmadụ ụka:

  • Chọta ohere i nwere ike iji na-akpanyere ndị mmadụ ụka mgbe ọ bụla ị na-anọghị n’ụlọ. Gwa Jehova gbasara ya, rịọkwa ya ka o nyere gị aka ịchọta ndị ga-ege ntị

  • Na-egosi ndị mmadụ na ihe ha masịrị gị, na-emetakwa ha enyi. Gbalịa ka ị mata ihe ụfọdụ gbasara ha. Ọ ga-enyere gị aka ịmata ihe Baịbụl kwuru ga-amasị ha

  • Gbalịa lee ma ị̀ ga-anata ha akara ekwentị ha ma ọ bụ adres ụlọ ha, ma ọ bụrụ na ọ dị mma ime otú ahụ

  • Ya ewutela gị ma ọ bụrụ na mkparịta ụka gị na mmadụ biri mgbe ị na-agbabereghị ya àmà

  • Na-eche gbasara onye ahụ mgbe unu kparịtachara ụka. Nọgide na-egosi ya na ihe ya masịrị gị. Otú ị ga-esi eme ya bụ izigara ya ihe ga-ebuga ya n’amaokwu Baịbụl ma ọ bụ n’isiokwu dị na jw.org

Megodị ihe a: Ọ bụrụ na mmadụ asị gị, ‘Olee otú ihe si gaa ná ngwụcha izu?,’ gwa ya otu ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ gbasara ọrụ ịkụzi Baịbụl ị na-arụ.

8. Mkpa Ọgbakọ

(Nkeji 5)

9. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) rr isi nke 6 ¶7-13, igbe 6A

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 65 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya