Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb25 Mach p. 14-15
  • Eprel 28–Mee 4

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eprel 28–Mee 4
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2025
mwb25 Mach p. 14-15

EPREL 28–MEE 4

ILU 11

Abụ nke 90 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

1. Ekwula Ya

(Nkeji 10)

Ekwula ihe ga-agbawa “onye agbata obi” gị obi (Ilu 11:9; w02 5/15 26 ¶4)

Ekwula ihe ga-akpata nkewa (Ilu 11:11; w02 5/15 27 ¶2-3)

Akọrọla ndị ọzọ ihe a na-achọghị ka ha mara (Ilu 11:12, 13; w02 5/15 27 ¶5)

Ebe ụmụnna nwoke abụọ na-akparịta ụka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu n’ime ha na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara nwanna nwoke ọzọ na-abịa n’ebe ha nọ.

AJỤJỤ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú ihe Jizọs kwuru na Luk 6:45 si enyere anyị aka izere ikwu okwu na-adịghị mma?

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Ilu 11:17​—Olee otú ịdị obiọma si abara anyị uru? (g20.1 11, igbe)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Ilu 11:1-20 (th ihe ọmụmụ nke 5)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Chọta ohere ị ga-eji agwa onye ahụ ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe n’oge na-adịbeghị anya. (lmd isi nke 2 nọmba nke 4)

5. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 4) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gosi onye ahụ otu n’ime vidio ndị dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)

6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

(Nkeji 4) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa mmadụ ka ị mụwara ya Baịbụl, gosikwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ ya. (lmd isi nke 10 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 157

7. Ekwela Ka Ire Gị Mee Ka Udo Gharazie Ịdị

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ikwu ihe na-adịghị mma. (Jems 3:8) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-echeta ihe ndị na-emekarị ka mmadụ kwuo okwu na-adịghị mma, ọ ga-enyere anyị aka izere ikwu ihe anyị ga-emecha kwaara mmakwaara. Lee ụdị okwu ụfọdụ nwere ike ime ka udo gharazie ịdị n’ọgbakọ:

  • Itu ọnụ. Mmadụ ito onwe ya nwere ike ime ka ya na ndị ọzọ marịtawa aka ma na-emere ibe ha anyaụfụ.​—Ilu 27:2

  • Ikwu ihe na-abụghị eziokwu. Ọ bụghị naanị mgbe mmadụ ghara ụgha chara acha ka a ga-asị na o kwuru ihe na-abụghị eziokwu. Mmadụ ịkpachara anya kwuo ihe ga-eduhie onye ọzọ sokwa na ya. Ọ bụrụgodị obere ihe na-abụghị eziokwu ka anyị kwuru, o nwere ike ime ka a gharazie ịtụkwasị anyị obi, mebiekwa aha ọma anyị.​—Ekli. 10:1

  • Asịrị. Ihe a bụ ụdị okwu na-abaghị uru a na-ekwu gbasara ndị ọzọ na otú ha si na-ebi ndụ ha. Ụdị okwu a anaghị abụcha eziokwu, ọ na-emekwa ka a gbaa ihe dịịrị ndị ọzọ n’anwụ. (1 Tim. 5:13) O nwere ike ịkpata esemokwu na nkewa

  • Iji iwe ekwu okwu. Ihe a bụ ụdị okwu anyị nwere ike ịgwa onye kpasuru anyị iwe ma ọ bụrụ na anyị ejideghị onwe anyị. (Efe. 4:26) O nwere ike ịgbawa mmadụ obi.​—Ilu 29:22

Foto ndị si na “Vidio Si na Vidio Bụ́ ‘Yipụnụ Àgwà’ Ndị Na-eme Ka Udo Ghara Ịdị.” 1. Ebe Emily na Celia nọ ọdụ na-ele ibe ha anya n’ebe a na-ere tii. Celia ji ekwentị na-ele ihe Haley tinyere n’ebe ndị mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet. 2. Ebe Haley ji iwe na-agwa Celia okwu n’ebe a na-adọsa ụgbọala n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Kpọnye Vidio Si na Vidio Bụ́ ‘Yipụnụ Àgwà’ Ndị Na-eme Ka Udo Ghara Ịdị. Jụzie ụmụnna ajụjụ a:

  • Gịnị ka ị mụtara gbasara otú ikwu ihe ga-akpaghasị udo dị n’ọgbakọ nwere ike isi dịrị anyị mfe?

Ị chọọ ihu otú ha si mee udo, lee vidio bụ́ “Na-achọ Udo ma Gbalịa Na-eme Udo.”

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) w23 Febụwarị, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 7 Mee Ka Baịbụl Ị Na-agụ Na-abakwuru Gị Uru ¶9-16 na igbe dị na peeji nke 13

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ Ọhụrụ Maka Mgbakọ Ukwu Afọ 2025 na Ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya