JUN 9-15
ILU 17
Abụ nke 157 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
Ebe di na nwunye bụ́ ndị Izrel ji obi ụtọ na-ata achịcha, obi rukwara ha ala
1. Ka Udo Dịrị n’Alụmdi na Nwunye Unu
(Nkeji 10)
Unu ga-agbarịrị mbọ iji dịrị n’udo. Ma, mbọ ọ bụla unu gbara ga-abara unu uru (Ilu 17:1; lee foto)
Unu ekwela ka obere ihe na-esere unu okwu (Ilu 17:9; g 11/14 11 ¶2)
Ọ bụrụgodị na a kpasuo gị iwe, jide onwe gị (Ilu 17:14; w08 5/1 10 ¶6–11 ¶1)
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Ilu 17:24—Olee otú o si bụrụ na “anya onye nzuzu anaghị adị otu ebe”? (it-1 790 ¶2)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Ilu 17:1-17 (th ihe ọmụmụ nke 10)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. (lmd isi nke 3 nọmba nke 5)
5. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 4) IKWUSA OZI ỌMA N’EBE NDỊ MMADỤ NA-ANỌKARỊ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 6 nọmba nke 4)
6. Okwu
(Nkeji 5) ijwbv isiokwu nke 60—Isiokwu: Gịnị Ka Ihe E Dere n’Ilu 17:17 Pụtara? (th ihe ọmụmụ nke 13)
Abụ nke 113
7. Mụta Ịkpa Àgwà Ndị Na-eme Ka A Na-ekwurịta Okwu Nke Ọma
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ikwurịta okwu nke ọma so n’isi ihe ndị na-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ana-ekwu ihe dị ha n’obi, ha ga na-emekọ ihe ọnụ, na-akwadokwa ibe ha n’oge nsogbu. (Ilu 15:22) Gịnị ka i nwere ike ime ka unu na-ekwurịta okwu nke ọma n’ezinụlọ unu?
Na-anọrịnụ. (Diut. 6:6, 7) Ọ bụrụ na ezinụlọ ana-arụkọ ọrụ ọnụ, na-emekọ ihe gbasara ofufe Jehova ọnụ, na-egwukọkwa egwu ọnụ, ha ga na-ahụkwu ibe ha n’anya ma na-atụkwasịkwu ibe ha obi. Ha ga na-enwekwa oge buru ibu ha ga-eji na-akọrị akụkọ. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịhapụ ihe ụfọdụ ị ga-achọ ime ma mee ihe ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ unu chọrọ ime. Ma, e nwere ọtụtụ uru ezinụlọ unu ga-emecha rite ma ị na-eme otú ahụ. (Fil. 2:3, 4) Olee ihe ndị kacha mma unu nwere ike iji oge unu nọkọrọ ọnụ na-eme?—Efe. 5:15, 16.
Kpọnye VIDIO Bụ́ Na-emenụ Ihe Ndị Ga-eme Ka Udo Dị n’Ezinụlọ—Na-ekwurịtanụ Okwu Otú Dị Mma. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:
Olee otú ịpịgharị ekwentị nwere ike isi mebie nkwurịta okwu n’ezinụlọ?
Olee ihe ọzọ ị mụtara na vidio a gbasara ikwurịta okwu nke ọma?
Na-ege ntị nke ọma. (Jems 1:19) Ọ ga-akara ụmụaka mfe ikwu ihe dị ha n’obi ma ọ bụrụ na ụjọ ejighị ha na ndị mụrụ ha ga-aghọtahie ha. N’ihi ya, mee ike gị niile ka iwe ghara ịbịa gị ma nwa gị kwuo ihe wutere gị. (Ilu 17:27) Kama iwe iwe, na-enwere ya ọmịiko mgbe ị na-ege ya ntị. Gbalịa ka ị ghọta echiche ya na otú obi dị ya, ka i nwee ike igosi ya na ị hụrụ ya n’anya ma medaa obi nyere ya aka.
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) w23 Mach, Isiokwu A Na-amụ Amụ nke 12, Si n’Ihe Ndị Jehova Kere Mụtakwuo Gbasara Ya ¶9-16