Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb15 p. 162-p. 163 para. 2
  • Mmadụ Iri Abụọ na Abụọ Hapụrụ Chọọchị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmadụ Iri Abụọ na Abụọ Hapụrụ Chọọchị
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
yb15 p. 162-p. 163 para. 2

DỌMINIKAN RIPỌBLIK

Mmadụ Iri Abụọ na Abụọ Hapụrụ Chọọchị

Foto dị na peeji nke 162

NWANNA German Gomera bụ nwa nke iri n’ime ụmụ iri na otu nne na nna ya mụrụ. Mgbe nna ya na ụmụnne ya ndị nwaanyị abụọ nwụrụ, mama ya aha ya bụ Luisa kpọọrọ ya na ụmụnne ya ndị ọzọ gaa n’obodo mepere emepe biri. N’ebe ahụ, ha banyere Chọọchị Menno. Ọ bụkwa chọọchị a ka ụmụnne mama ya ndị nwoke na ndị ezinụlọ ha na-aga.

Nwanna German sịrị: “N’afọ 1962, e zitere otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo anyị. Ndị obodo anyị kwuru na ha ji ozizi ụgha na-eduhie ndị mmadụ. Ma, mgbe di na nwunye ahụ bịara ileta Piña na ezinụlọ ya, ha nabatara ha. Ezinụlọ Piña buru ibu. Otú di na nwunye a si mesapụrụ ha ihu mere ka ha gee ha ntị. Ọbịbịa ha bịara na nke Piña ha mere ka ha na ụmụnne m ndị nwaanyị atọ tọrọ m malite ịmụ Baịbụl.”

Nwanna German kwukwara, sị: “Otu ụbọchị, mgbe di na nwunye ahụ bịara ịmụrụ Piña na ndị ezinụlọ ya Baịbụl, ha gwara mama m ka ọ bịa soro ha. Ha gụụrụ ya amaokwu Baịbụl ndị kwuru na ndị mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa a. Mgbe ha gụchara, mama m jụrụ ha, sị, ‘Gịnịzi mere ha ji akụziri anyị na chọọchị na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe?’ Mgbe nwanna nwoke ahụ gụchaara ya Baịbụl ma kọwaara ya na Baịbụl kwuru na e nwere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha ebiri n’ụwa, mama m kwetara ihe ndị ahụ a kụziiri ya. Ọ malitekwara ịkụziri ndị ọzọ ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl.

“Mgbe ndị pastọ Chọọchị Menno matara na ndị òtù ha na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, ha gbalịsiri ike ka ha kwụsị ha ịmụ Baịbụl. Ha badịịrị ha mba na ha ga-eme ha ihe. Ma, nwunye Piña aha ya bụ Maximina gwara ndị pastọ ha, sị, ‘Ka m gwa unu, abụghị m taata. Ọ bụ m ga-ekpebi ihe m ga-eme.’”

Nwanna German kwuziri, sị, “Mmadụ iri abụọ na abụọ mechara hapụ Chọọchị Menno soro Ndịàmà Jehova na-aga ọmụmụ ihe. E mere mama m baptizim n’afọ 1965, mee m n’afọ 1969 mgbe m dị afọ iri na atọ.”

Foto dị na peeji nke 163

Foto a bụ foto Nwanna German na ụmụnne ya ndị nwaanyị. Ha niile na-efe Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya