Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb16 p. 101
  • O Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezi Ndị Agbata Obi Bara Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ebiela M Ndụ Baara M Ezigbo Uru
    Teta!—2011
  • “Ahụtụbeghị M Ndị Agbata Obi Dị Ka Unu”
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
  • Ikpebisi Ike Ịba Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ
    Teta!—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
yb16 p. 101

INDONESHIA

O Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe

Thio Seng Bie

  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1906

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1937

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụ okenye ji obi ya niile fee Jehova. O diri ike e mesiri ya n’ihi agbụrụ o si.—Ọ bụ nwa ya nwaanyị aha ya bụ Thio Sioe Nio kọrọ akụkọ a.

Onye a bụ Nwanna Thio Seng Bie

N’ỌNWA Mee afọ 1963, ndị na-achọghị iji anya ahụ ndị Chaịna kpatara ọgba aghara n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Java. Ebe ọgba aghara a kacha kpụrụ ọkụ n’ọnụ bụ n’obodo Sukabumi, bụ́ ebe ezinụlọ anyị nwere gwongworo ndị na-agbara anyị n’ụzọ. Ọtụtụ narị mmadụ, bụ́ ndị na-eme ara ara nakwa ụfọdụ ndị agbata obi anyị kụkara ụlọ anyị bata, mebisie ihe anyị, ma zuru ngwongwo anyị. Ezigbo ụjọ ji anyị, anyị niile agbakọta otu ebe na-ele ihe na-emenụ.

Mgbe ndị ahụ lara, ụfọdụ ndị agbata obi anyị bịara ka ha kasie anyị obi. Ha na papa m nọ n’ala na palọ kparịta ụka. Papa m hụrụ Baịbụl ya e dere n’asụsụ Sudaniiz ná ngwongwo anyị ndị a tụsasịrị n’ụlọ anyị. O mepere ya gwa ndị agbata obi anyị na Baịbụl kwuru na ụdị ihe a merenụ ga-eme. Ọ kọwaara ha banyere Alaeze Chineke anyị na-atụ anya ya, bụ́ nke na-eme anyị obi ụtọ.

Mkpa papa m abụghị ịkpakọbara onwe ya akụ̀ n’ụwa ebe a. Ọ na-agwakarị anyị, sị: “Ihe gbasara ofufe Chineke kwesịrị ịbụ ihe mbụ ná ndụ anyị.” Ofufe Chineke o ji kpọrọ ihe mere ka ụmụ ya isii, papa ya dị́ afọ iri itoolu, mama anyị, ọtụtụ ndị ikwu anyị, nakwa ọtụtụ ndị agbata obi anyị bata n’ọgbakọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya