- Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
LUK
IHE NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ A
1
Akwụkwọ ozi e degaara Tiofilọs (1-4)
Mmụọ ozi Gebriel kwuru na a ga-amụ Jọn Onye Na-eme Baptizim (5-25)
Mmụọ ozi Gebriel kwuru na a ga-amụ Jizọs (26-38)
Meri gara na nke Elizabet (39-45)
Meri toro Jehova (46-56)
Mgbe a mụrụ Jọn na mgbe a gụrụ ya aha (57-66)
Amụma Zekaraya buru (67-80)
2
Mgbe a mụrụ Jizọs (1-7)
Ndị mmụọ ozi pụtara n’ihu ndị ọzụzụ atụrụ (8-20)
Ibi Jizọs úgwù na ime ka ha dị ọcha (21-24)
Simiọn hụrụ Kraịst (25-35)
Ana kwuru gbasara Jizọs (36-38)
Ha laghachiri Nazaret (39, 40)
Jizọs gara n’ụlọ nsọ mgbe ọ dị afọ iri na abụọ (41-52)
3
Mgbe Jọn bidoro ozi ya (1, 2)
Jọn gwara ndị mmadụ ka ha mee baptizim (3-20)
Mgbe Jizọs mere baptizim (21, 22)
Usoro ọmụmụ Jizọs Kraịst (23-38)
4
Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa (1-13)
Mgbe Jizọs malitere ikwusa ozi ọma na Galili (14, 15)
Ndị Nazaret jụrụ Jizọs (16-30)
Mgbe Jizọs gara n’ụlọ nzukọ dị na Kapaniọm (31-37)
Jizọs gwọrọ nne nwunye Saịmọn nakwa ndị ọzọ (38-41)
Ìgwè mmadụ hụrụ Jizọs ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị (42-44)
5
E ji ọrụ ebube gbute azụ̀; ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs (1-11)
A gwọrọ onye ekpenta (12-16)
Jizọs gwọrọ onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ (17-26)
Mgbe Jizọs kpọrọ Livaị (27-32)
Ajụjụ gbasara ibu ọnụ (33-39)
6
Jizọs bụ “Onyenwe Ụbọchị Izu Ike” (1-5)
Jizọs gwọrọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ (6-11)
Ndịozi iri na abụọ (12-16)
Jizọs ziri ndị mmadụ ihe, gwọọkwa ndị ọrịa (17-19)
Ndị na-enwe obi ụtọ na ndị ga-ata ahụhụ (20-26)
Hụnụ ndị iro unu n’anya (27-36)
Kwụsịnụ ikpe ikpe (37-42)
A na-eji mkpụrụ osisi amata osisi ọ bụla (43-45)
Ụlọ a rụrụ nke ọma na ụlọ na-enweghị ezigbo ntọala (46-49)
7
Onyeisi ndị agha nke nwere okwukwe (1-10)
Jizọs kpọlitere nwa otu nwaanyị isi mkpe na Nen (11-17)
Jizọs toro Jọn Onye Na-eme Baptizim (18-30)
Jizọs mara ọgbọ na-egeghị ya ntị ikpe (31-35)
Jizọs gbaghaara otu nwaanyị bụ́ onye mmehie (36-50)
8
Ụmụ nwaanyị ndị na-eso Jizọs (1-3)
Ihe atụ gbasara ọgha mkpụrụ (4-8)
Ihe mere Jizọs ji jiri ihe atụ na-akụzi ihe (9, 10)
A kọwara ihe atụ gbasara ọgha mkpụrụ (11-15)
E kwesịghị ikpuchi ọkụ ihe (16-18)
Nne na ụmụnne Jizọs (19-21)
Jizọs mere ka ebili mmiri dajụọ (22-25)
Jizọs gwara ndị mmụọ ọjọọ ka ha banye n’ime ìgwè ézì (26-39)
Ada Jaịrọs na otu nwaanyị nke bitụrụ uwe elu Jizọs aka (40-56)
9
Jizọs nyere ndịozi ya iri na abụọ ntụziaka gbasara ikwusa ozi ọma (1-6)
Ihe gbasara Jizọs gbara Herọd gharịị (7-9)
Jizọs nyere puku ụmụ nwoke ise nri (10-17)
Pita kwuru na Jizọs bụ Kraịst (18-20)
Jizọs kwuru na a ga-egbu ya (21, 22)
Ihe e ji ama ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs (23-27)
Jizọs nwoghara (28-36)
Jizọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ nke ji otu nwatakịrị nwoke (37-43a)
Jizọs kwukwara ọzọ na a ga-egbu ya (43b-45)
Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-azọ onye kacha ukwuu n’ime ha (46-48)
Onye ọ bụla na-anaghị emegide anyị dịnyeere anyị (49, 50)
Otu obodo nke dị na Sameria anabataghị Jizọs (51-56)
Otú e si eso ụzọ Jizọs (57-62)
10
Jizọs zipụrụ mmadụ iri asaa (1-12)
Obodo ndị na-echegharịghị ga-ata ahụhụ (13-16)
Mmadụ iri asaa Jizọs zipụrụ lọtara (17-20)
Jizọs toro Nna ya maka ịhọrọ ndị na-enweghị ihe ha bụ (21-24)
Ihe atụ gbasara onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi (25-37)
Jizọs gara leta Meri na Mata (38-42)
11
Otú e si ekpe ekpere (1-13)
Jizọs ji ike Chineke chụpụ ndị mmụọ ọjọọ (14-23)
Mgbe mmụọ ọjọọ lọghachiri ebe o si pụọ (24-26)
Ihe na-eme ka e nwee ezigbo obi ụtọ (27, 28)
Ọrụ ebube a rụụrụ Jona (29-32)
Anya dị ka ihe na-enye ahụ́ ìhè (33-36)
Ndị okpukpe, bụ́ ndị ihu abụọ, ga-ata ahụhụ (37-54)
12
Ihe iko achịcha ndị Farisii (1-3)
Na-atụ Chineke egwu, atụla egwu mmadụ (4-7)
Onye na-agwa ndị mmadụ na ya ma Kraịst (8-12)
Ihe atụ gbasara otu nwoke nzuzu bara ọgaranya (13-21)
Kwụsịnụ ichegbu onwe unu (22-34)
Ịmụrụ anya (35-40)
Ohu kwesịrị ntụkwasị obi na ohu na-ekwesịghị ntụkwasị obi (41-48)
Iweta nkewa, ọ bụghị udo (49-53)
Ịghọta ihe na-eme n’oge a (54-56)
Idozi okwu (57-59)
13
A ga-ebibi unu ma ọ bụrụ na unu echegharịghị (1-5)
Ihe atụ gbasara osisi fig na-amịghị mkpụrụ (6-9)
Otu nwaanyị na-ehu ehu a gwọrọ n’Ụbọchị Izu Ike (10-17)
Ihe atụ gbasara mkpụrụ osisi mọstad na ihe iko achịcha (18-21)
Onye chọrọ isi n’ọnụ ụzọ dị warara banye ga-agbarịrị mbọ (22-30)
Herọd bụ “nkịta ọhịa” (31-33)
Jizọs beere Jeruselem ákwá arịrị (34, 35)
14
Jizọs gwọrọ otu nwoke aka ya na ụkwụ ya zara aza (1-6)
Gaa nọrọ ebe kacha ala ma a kpọọ gị oriri (7-11)
Kpọọ ndị na-enweghị ihe ha ga-eji kwụghachi gị oriri (12-14)
Ihe atụ gbasara ndị a kpọrọ oriri na-ekweghị abịa (15-24)
Ihe ọ ga-efu mmadụ iji bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs (25-33)
Ọ bụrụ na nnu anaghịzi atọ ka nnu (34, 35)
15
Ihe atụ gbasara atụrụ furu efu (1-7)
Ihe atụ gbasara mkpụrụ ego furu efu (8-10)
Ihe atụ gbasara nwa mmefu (11-32)
16
Ihe atụ gbasara onye na-elekọta ụlọ bụ́ ajọ mmadụ (1-13)
Iwu Mosis na Alaeze Chineke (14-18)
Ihe atụ gbasara ọgaranya na Lazarọs (19-31)
17
Ihe nwere ike ime ka mmadụ mehie, mgbaghara, na okwukwe (1-6)
Ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla (7-10)
Jizọs gwọrọ mmadụ iri na-arịa ekpenta (11-19)
Otú Alaeze Chineke ga-esi abịa (20-37)
18
Ihe atụ gbasara nwaanyị isi mkpe nke nọ na-enye otu ọkàikpe nsogbu (1-8)
Onye Farisii na onye ọnaụtụ (9-14)
Jizọs na ụmụntakịrị (15-17)
Ajụjụ otu onye na-achị achị bara ọgaranya jụrụ (18-30)
Jizọs kwukwara ọzọ na a ga-egbu ya (31-34)
Jizọs mere ka otu onye arịrịọ kpuru ìsì hụwa ụzọ (35-43)
19
Jizọs gara n’ụlọ Zakịọs (1-10)
Ihe atụ gbasara maịna iri (11-27)
Jizọs gbaara jakị banye Jeruselem ka eze (28-40)
Jizọs beere Jeruselem ákwá (41-44)
Jizọs mere ka ụlọ nsọ dị ọcha (45-48)
20
A jụrụ Jizọs onye nyere ya ikike o ji arụ ọrụ (1-8)
Ihe atụ gbasara ndị ọrụ ubi gburu mmadụ (9-19)
Chineke na Siza (20-26)
A jụrụ Jizọs ajụjụ gbasara mbilite n’ọnwụ (27-40)
Kraịst ọ̀ bụ nwa Devid? (41-44)
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpachara anya maka ndị odeakwụkwọ (45-47)
21
Mkpụrụ ego abụọ nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye ji nye onyinye (1-4)
IHE ÀMÀ NKE IHE GA-EME (5-36)
Agha, oké ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, ụkọ nri (10, 11)
Ìgwè ndị agha ga-agba Jeruselem gburugburu (20)
Oge ndị mba ọzọ (24)
Ọbịbịa Nwa nke mmadụ (27)
Ihe atụ gbasara osisi fig (29-33)
Na-echenụ nche (34-36)
Jizọs ziri ihe n’ụlọ nsọ (37, 38)
22
Ndị isi nchụàjà kpara nkata igbu Jizọs (1-6)
A kwadebere Ememme Ngabiga ikpeazụ Jizọs mere (7-13)
Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị (14-20)
“Mụ na onye ga-arara m nye nọ na tebụl a” (21-23)
Ndị na-eso ụzọ Jizọs sere ezigbo okwu (24-27)
Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gbara ndụ na ha ga-eso ya chịa n’alaeze (28-30)
Jizọs kwuru na Pita ga-agọnahụ ya (31-34)
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha dị njikere; ha gosiri ya mma agha abụọ (35-38)
Ekpere Jizọs kpere n’Ugwu Oliv (39-46)
Mgbe e jidere Jizọs (47-53)
Pita gọnahụrụ Jizọs (54-62)
A kwara Jizọs emo (63-65)
Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe na Sanhedrin (66-71)
23
Mgbe Jizọs nọ n’ihu Paịlet na Herọd (1-25)
A kwụwara Jizọs na ndị ohi abụọ n’osisi (26-43)
Mgbe Jizọs nwụrụ (44-49)
Mgbe e liri Jizọs (50-56)
24
Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ (1-12)
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aga Emeọs (13-35)
Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya (36-49)
Chineke kpọọrọ Jizọs laa eluigwe (50-53)