Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 1/8 p. 26-28
  • Nke Mbụ Ya na Mali

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nke Mbụ Ya na Mali
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezi Ihe Ịma Aka
  • Njupụta nke Ihe Omume
  • Nraranye Na-akpali Akpali
  • Mkpakọrịta Ọzọ Na-ekpo Ọkụ
  • Ụlọ Nzukọ Alaeze Gheere Oghe Nye Onye Ọ Bụla
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Inwe Ebe Ndị A Na-anọ Efe Jehova
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ebe A Ka Anyị Na-anọ Efe Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Teta!—1996
g96 1/8 p. 26-28

Nke Mbụ Ya na Mali

DI M na-eje ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova na Mali, mba nwere ụba mmadụ na-ebuchaghị ibu nke dị n’ọdịda anyanwụ Africa. Ọzara Sahara gbasazuru akụkụ ebe ugwu ya, ala ahịhịa kpuchiri mejupụtakwara ihe ka ukwuu n’ebe fọdụrụ ná mba ahụ. Mali buru ibu karịa ma e jikọọ England, France, na Spain ọnụ. Ọ bụ ezie na mba ndị a nwere ihe karịrị 140 nde mmadụ bi na ha, Mali nwere ụba mmadụ nke nanị ihe dị ka nde iri—nke ihe dị ka 150 n’ime ha bụ Ndịàmà.

Ụlọ ebe anyị na-esi amalite njem dị na Ziguinchor, obere obodo dị na Senegal gbara ya agbata obi. Na November 1994 anyị si n’ebe ahụ fega na Dakar, mgbe ahụ gaa n’isi obodo Mali, bụ́ Bamako, obodo ukwu nke nwere ihe karịrị ọkara nde mmadụ ndị bi n’ime ya. Site na Bamako anyị ji tagzi ọhịa, bọs, ma ọ bụ ụgbọ okporo ígwè mee njem gaa n’obodo ndị ka nta, dị ka Ségou, San, na obodo ukwu ochie bụ Mopti. Anyị nọrọ na nke ọ bụla n’ime ebe ndị a ruo ihe dị ka otu izu iji soro Ndịàmà ole na ole nọ n’ebe ahụ kere òkè n’ozi ndị Kraịst.

Na December anyị laghachiri Bamako iji jee mgbakọ distrikti, bụ́ nke nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara bụ́ 273. Lee ọṅụ anyị nwere ịhụ 14 ndị ọhụrụ e mere baptism! Ụbọchị na-esonụ mgbakọ ahụ gasịrị, anyị jiri bọs pụọ gaa obere obodo bụ Sikasso, ebe e mere ndokwa ịrara Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ Ndịàmà Jehova wuru na Mali nye ná ngwụsị izu na-eso ya.

Ezi Ihe Ịma Aka

Nanị Ndịàmà 13 mejupụtara ọgbakọ dị na Sikasso, nke 5 n’ime ha bụ ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile. Mgbe anyị rutere na Monday, anyị nwere ọchịchọ siri ike ịnụ ihe ndị bụ atụmatụ ha maka nraranye ahụ. Ha gwara anyị na ha na-adabere n’ebe di m, bụ́ Mike nọ, idokwa maka ya! Ya mere mgbe anyị bupụtasịrị ibu anyị, anyị pụrụ ịga hụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Mgbe anyị na-ahụ ya, anyị nwere ọṅụ dị ukwuu na nanị Ndịàmà ole na ole ndị a pụrụ iwu ụlọ dị otú ahụ. Otú ọ dị, a ka nwere ọtụtụ ihe ime. E nweghị ákwà mgbochi, e tebeghị èzí ya ágbá, e nweghịkwa ihe odide bụ́ “Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova.”

Anyị matara na n’ime ụbọchị ole na ole, ọ dịkarịa ala 50 ndị nleta ga-esi Bamako bịa maka nraranye ahụ. A kpọwokwa ndị bi n’ebe ahụ òkù. Ọgbakọ ahụ nwere nanị otu onye okenye, Pierre Sadio. Mgbe anyị jụrụ ya otú o si atụ anya ịrụcha ụlọ nzukọ ahụ tupu Saturday, bụ́ ụbọchị nraranye ahụ, ndị enyi ahụ bịaruru nso iji nụrụ nzaghachi ya. “Echere m na Jehova ga-enyere anyị aka ịrụcha ya n’oge,” ka ọ na-aza.

A ghaghị ime ọtụtụ ihe n’ime mkpirikpi oge dị otú ahụ! Alatụrụ m azụ n’ịjụ ma m pụrụ inye aka iweta ákwà mgbochi ndị ahụ. Nnukwu mmụmụ ọnụ ọchị nke ahụ efe pụtara n’ihu ndị nọ m gburugburu. Mgbe ahụ Mike tụrụ aro ka anyị mee ihe odide maka ihu ụlọ nzukọ ahụ. N’oge na-adịghị anya anyị nile na-ekwu okwu n’otu mgbe. Onye ọ bụla nwere oké mkpali. Ọ ga-abụ ezi ihe ịma aka ịrụcha ihe nile fọdụrụnụ n’ụlọ nzukọ ahụ n’oge!

Njupụta nke Ihe Omume

Anyị bụ ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Kraịst gbagara n’ahịa ozugbo ịzụrụ ákwà ahụ. E mesịa anyị chọtara onye ọkwa ákwà ka o mee ákwà mgbochi ndị ahụ. “I nwere ụbọchị anọ iji kwachaa ha,” ka anyị na-agwa ya. Iji mee ihe ga-ama mma n’anya, Mike wepụtara onwe ya ime ihe nkowe e ji mkpa akwụkwọ macramé mee maka ihu ụlọ nzukọ ahụ. Ya mere anyị pụkwara ọzọ, ugbu a ịga chọta eriri dị mkpa maka ihe nkowe akwụkwọ ahụ tinyekwara iji chọta ite e ji akụ okooko osisi.

E mekwara ndokwa ka otu onye nweta ihe odide nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. N’ime na n’azụ ụlọ nzukọ ahụ, e nwere njupụta nke ihe omume. Ìgwè nke ndị agbata obi gbakọtara ikiri ihe na-eme. E nwere ọtụtụ ihe ime! Olee otú anyị ga-esi nye 50 ndị ọbịa nri? Olee ebe ha ga-arahụ ụra? Anyị gbagharịrị izu ahụ dum iji mee nkwadebe, ma o yighị ka ihe ọ bụla na-aga nke ọma.

Anyị tetara n’ụra n’oge na Friday, ụbọchị bu nke nraranye ahụ ụzọ. Ebe nile jupụtara n’oké mkpali n’ihi na ndị ọbịa sitere Bamako gaje ịbịa. N’ihe dị ka n’oge ehihie, ihe odide nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ rutere. Mgbe Mike kpughepụrụ ya, ụmụnna ndị ahụ kudara ume n’igosi mmasị. Ọbụna ndị ji oké ọchịchọ bịa ikiri ihe na-eme ji obi ekele na-ekiri. Anyị nọgidere na-echere n’ebe ahụ ka a na-akụnye ya n’ahụ ájá dị n’ihu. Ugbu a o doro anya na nke a abụghị nanị ụlọ efu. Ọ bụ “Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova.”

N’ebe dị nso n’ebe ahụ, n’ụlọ otu onye ọsụ ụzọ, ụmụnna nwanyị na-esi ihe oriri. Otu nnukwu ite ojii jupụtara ná nri. Anyị ka chịpụsịrị bọket ágbá na azịza n’akụkụ ụlọ nzukọ ahụ mgbe oké iti mkpu dapụtara: “Ha abịala! Ha abịala!” Ndị enyi ahụ si n’ụlọ nzukọ ahụ gbapụta, ndị ọzọ gbapụtara n’ụlọ. Ihe a dum juru ndị agbata obi anya. Ụmụnna ndị ahụ gbara egwú n’oké mkpali. Lee ụdị nnabata ndị enyi ahụ nwetara mgbe ha siri na bọs pụta! Enwere m mmetụta nke nganga dị ukwuu ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova!

Elere m anya gburugburu n’ebe ndị ọbịa ahụ nọ—ndị enyi sitere agbụrụ mba ahụ ha na ndị sitere Burkina Faso na Togo. Ndị America, ndị Canada, ndị France, na ndị Germany abịawokwa. N’abalị ahụ anyị nwere oriri buru ibu. Anyị kwanyere ọkụ buru ibu iji nye ìhè n’ebe obibi ahụ. Ọ dị m ka m tụọ onwe m mbọ iji jide n’aka na m na-enwe ihe ùgwù nke ịbụ akụkụ nke ihe omume ahụ n’ezie. Ka uhuruchi ahụ na-agafe, anyị ji enwechaghị mmasị malite ịga n’ebe dị iche iche anyị ga-ehi ụra.

E nyere ihe dị ka 20 ụlọ n’otu ebe obibi. Achọpụtara m na o siiri ụfọdụ ike. Ahụrụ m ka otu nwanna nwanyị bụ amaala dugara otu onye ọbịa si France n’ụlọ mposi dị n’èzí. Onye ọbịa ahụ bụ onye ikwu nke otu n’ime ndị ozi ala ọzọ, ma ya onwe ya abụghị Onyeàmà. Ka ha na-alaghachi, ọ sịrị: “Unu dara nnọọ ogbenye, ma unu na-egosi ịhụnanya, nweekwa obi ọma.” Ọ dị m ka m kwuo, sị: “Ee e, ha adaghị ogbenye. Ndị Jehova nile bara ọgaranya!” N’ezie, olee ebe ọzọ ị pụrụ ịhụ ìgwè mmadụ gwara ọgwa dị otú ahụ ka ha na-ebi n’udo na n’ịdị n’otu?

Nraranye Na-akpali Akpali

Abalị ahụ dị mkpirikpi, ụbọchị nraranye ahụ rutekwara ngwa ngwa. Mgbe e nwesịrị nzukọ maka ozi ubi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ndịàmà pụrụ ma kpọọ ndị obodo ahụ òkù ịbịa nraranye ahụ. Esoghị m jee ka m wee nwee ike ịhazi okooko osisi na osisi nta dị iche iche. Ụmụnna nwanyị obodo ahụ ji nnọọ ọrụ n’aka na-esi nri maka uhuruchi.

N’ikpeazụ, n’elekere anọ, oge nraranye ahụ ruru. Ngụkọta nke 92 bịara, ma ụlọ nzukọ ahụ ejubigaghị ókè. Enwere m oké mkpali nke na o siiri m ike ịnọdụ ala n’otu ebe. Pierre Sadio kọrọ akụkọ nke ọrụ ahụ na Sikasso. Mgbe e kenyere ya ọrụ n’ebe a, ọ bụ nanị ya na nwunye ya na ụmụ ha abụọ. Ndụ siri ike nke ukwuu, ma ka oge na-aga Jehova gọziri ozi ha. Onye mbụ ghọrọ Onyeàmà na Sikasso bụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche ugbu a. Mgbe ahụ Pierre kọwara otú Ndịàmà ole na ole ndị ahụ siri nwee ike iwu ihe. Ha goro onye na-edo blọkụ, ọgbakọ dum rụkwara ọrụ n’ihe owuwu ahụ kwa Sunday.

Ugbu a Mike gbara Ndịàmà rụrụ ọrụ n’ụlọ nzukọ ahụ ajụjụ ọnụ. N’otu n’otu, ọ na-ajụ ha ma ọ̀ dị mgbe ha chere na ụbọchị a ga-abịa, na otú ọ dị ha mgbe ha na-ele anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ jupụtara na mmadụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nwere mgbachi akpịrị nke na ha enweghị ike ịzacha ajụjụ ha. N’etiti Ndịàmà nọ n’ebe ahụ, e nweghị onye na-ebughị anya mmiri n’anya.

Ọzọ Ted Petras sitere alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova na Senegal kwuru okwu nraranye ahụ. E kpere ekpere nraranye ahụ, ụmụnna ndị ahụ kụkwara aka ruo ogologo oge dị ukwuu. E mesịa Mike kwuru ka onye ọ bụla nyere aka n’iwu ụlọ nzukọ ahụ pụta n’ihu. Ha guzoro n’ebe ahụ, ihu ha gbachapụrụ agbachapụ, anya mmiri nke ọṅụ na-agbapụta ha n’anya. Ka anyị na-abụ abụ mmechi, enwere m oké obi ụtọ. Ịbụ onye ozi ala ọzọ na-enye m ohere ikere òkè n’ihe ka ukwuu n’ime ahụmahụ ndị magburu onwe ha. Ihe dị ukwuu gaara efunahụwo anyị ma ọ bụrụ na anyị nọ n’ụlọ na United States.

Mkpakọrịta Ọzọ Na-ekpo Ọkụ

Mgbe nraranye ahụ gasịrị, e nyere ihe oriri ntụrụndụ. Ụmụnna nwanyị batara n’otu n’otu na-eburu nnukwu efere watermelon dị na ha n’isi ha. Ụmụnna nwoke abụọ na-eso ha, na-eyi okpu osi ite maka ememe ahụ, na-eburukwa efere a wụnyere achịcha. E ji iberibe oroma na nke lemon chọọ achịcha ndị dị mbadamba mma. Ebe ahụ dum nwere ọdịdị nke ememe.

Ndị ọbịa ahụ lara mgbe e nyesịrị ha ihe oriri. Mgbe ahụ Ndịàmà gara n’otu ụlọ dị nso n’ebe ahụ maka nri abalị ahụ. Anyị nile nọdụrụ ala n’èzí n’okpuru ọnwa zuru ezu, ọkụ na-enwu oké onwunwu nyekwara ìhè n’ogige ebe obibi ahụ. Enwere m oké mkpali na ike ọgwụgwụ n’ihi ihe omume nke ụbọchị ahụ nke na apụghị m iricha nri m. Enyere m otu nwa agbọghọ nta ụkwụ ọkụkọ m tafọrọ. Ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ ahụ leruru efere anyị anya nke ọma, ọ bụrụkwa na e nwere ihe fọdụrụnụ, ha eritọpụ ya. A dịghị enwe nri e rifọrọ erifọ n’ebe a. A zụtọrọ anyị nke ukwuu na United States.

Ka uhuruchi anyị na-abịa ná njedebe, otu nwanna nwoke chetaara ndị si Bamako bịa na bọs ga-abịa buru ha n’elekere 9:15 ụtụtụ. N’ụtụtụ na-esochi ụmụnna ndị ahụ nọ n’ogige ebe obibi ahụ dum, na-eche ka bọs rute. Mgbe ahụ anyị bụrụ abụ ikpeazụ anyị, “Anyị Na-ekele Gị, Jehova.” Anya mmiri malitere ịgbapụta, ozugbo anyị na-abụchakwa ya, bọs rutere. Ụmụnna ndị ikom na ndị inyom ahụ dum makụrụ onwe ha.

Anyị guzoro n’ebe ahụ na-efe aka ka bọs ahụ ji nwayọọ nwayọọ na-apụ. Ndị nile nọ n’ime bọs ahụ na-efe aka ruo mgbe ọ pụrụ n’anya. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị ndị fọdụrụnụ tụgharịrị ile onwe anyị anya. Ọ bụ n’ezie nraranye magburu onwe ya na izu magburu onwe ya.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.

[Foto dị na peeji nke 27]

Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ Ndịàmà Jehova wuru na Mali

[Foto dị na peeji nke 28]

Ìgwè obi ụtọ a ji bọs mee njem

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya