Ọ̀ Dị Onye A Pụrụ Ịtụkwasị Obi?
“O so ná mmadụ ole na ole na-abụghị ndị ezinụlọ anyị nne na nna m tụkwasịrị obi n’ụzọ nile. . . . O gosiri onwe ya ịbụ onye ọma na onye na-eche maka ndị ọzọ nke na-agaghị emejọ anyị ma ọlị. . . . O so ná mmadụ ole na ole ná ndụ m m tụkwasịrị obi kpam kpam.”
NKE ahụ bụ otú otu nwa agbọghọ si kọwaa obi ọ tụkwasịrị dọkịta ezinụlọ ya. Ọ dị mwute ikwu na ọ bụ ntụkwasị obi hiere ajọ ụzọ. Site na mgbe ọ dị afọ 16, dọkịta a metọrọ ya n’ụzọ mmekọahụ. “Ọ ghaara m ụgha ma ghọgbuo m,” ka ọ gwara ndị isi ụlọikpe, bụ́ ndị hụziri na e mezuru ikpe.—The Toronto Star.
A Na-emebi Ntụkwasị Obi n’Ebe Nile
Ntụkwasị obi, dị ka okooko osisi mara mma ma dị nro, dị mfe ifopụ ma zọtọọ. A na-egwepịa ya n’ebe nile! Michael Gaine, onye bụbu odeakwụkwọ nke otu kadịnal na otu achịbishọp n’England, kwuru, sị: “E nwere oge mgbe onye ọ bụla na-atụkwasị ụkọchukwu obi. Mgbe ezinụlọ ga-enyefe ụmụ ha ná nlekọta ya. Agaghị m atụ anya nke ahụ ugbu a. A napụwo anyị ntụkwasị obi ahụ ruo mgbe ebighị ebi.”—The Guardian Weekend.
Ndị achụmnta ego na-aghọrị ndị na-ama ha aka. Ndị mkpọsa dị aghụghọ na-aghọgbu ma na-erigbu ndị ahịa. Otu onye isi moro obi n’azụ rikpọrọ ego ụgwọ ezumike nke ụlọ ọrụ ya, na-ezunara ndị ọrụ ya ego ha chekwara. Ọtụtụ mgbe ndị e were n’ọrụ na-ezu ndị were ha n’ọrụ ohi. Dị ka ihe atụ, otu akụkọ rịbara ama na “achụmnta ego ndị nke Canada na-enwe mfu nke ihe dị ka $20 ijeri kwa afọ site n’ohi ndị ọrụ zuru.”—Canadian Business.
Ọ bụghị ndị ọchịchị nile ka a na-apụghị ịtụkwasị obi. Ma akụkọ ndị dị ka nke na-eso na-atụ nanị mmadụ ole na ole n’anya: “Izu abụọ ka e gbusịrị otu n’ime ụmụ nwanyị ndọrọ ndọrọ ọchịchị a kasị anụ mkpọtụ ha na France, ndị uwe ojii na-agba n’anwụ ihe nzuzo nile nke aghụghọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nkwekọrịta ime mpụ nke kpuchiworo ihe omume gọọmenti eri ogologo oge n’ụsọ osimiri Mediterranean.”—The Sunday Times, London.
Ọtụtụ mgbe, ná mmekọrịta ndị chiri anya a na-etisa ntụkwasị obi. Ndị di na nwunye na-aghọrị ibe ha. Ndị nne na nna na-emetọ ụmụaka. Ụmụaka na-aghọgbu ndị nne na nna. Mgbe e mepere ebe ndebe ihe mgbe ochie nke Stasi, ndị uwe ojii nzuzo n’ebe bụbu Ọwụwa Anyanwụ Germany, ha kpughere “usoro jọgburu onwe ya nke nghọgbu” site n’aka ndị e lere anya dị ka ndị enyi. N’usoro nke imebi ntụkwasị obi, ka otu akụkọ na-ekwu, “aka Stasi gbatịpụrụ banye n’ọnụ ụlọ akwụkwọ, ikpo okwu ndị ụkọchukwu, ọnụ ụlọ ihi ụra, ọbụna n’ebe nkwupụta mmehie.”—Time.
Na Ireland otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ dere, sị: “Ndị anyị tinyere n’ọkwá inwe ike aghaworo anyị ụgha, duhie anyị, rigbuokwa anyị, metọọkwa anyị ma jiri anyị mee ihe ọchị.” (The Kerryman) N’ihi na e mebiwo ntụkwasị obi ha ọtụtụ mgbe otú a, ọtụtụ ndị adịghị atụkwasị onye ọ bụla obi. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji jide n’aka na ntụkwasị obi anyị ehieghị ụzọ? Isiokwu abụọ na-esonụ ga-enyocha ajụjụ a.