Echiche nke Bible
Ihe Ị Ga-eme Mgbe I Mejọrọ Ndị Ọzọ
Ọ DỊ ihe na-adịghị agazi. Ị maara ya nnọọ. Nwanna gị n’ime Kraịst na-eze gị eze. O kwubeghị ihe na-enye ya nsogbu, ma ọ na-esiri ya ike ikwe gị ekele—ọ bụkwa nanị ma i buru ụzọ kelee ya! Ì kwesịrị ijekwuru ya iji chọpụta ihe gahiere?
‘Nke ahụ gbasara ya,’ ka ị pụrụ iche. ‘Ọ bụrụ na ọ dị ihe o nwere megide m, o kwesịrị ịbịa gwa m banyere ya.’ N’ezie, Bible na-agba onye e mejọrọ ume ibute ụzọ n’iso nwanna ya mee udo. (Tụlee Matiu 18:15-17.) Ma gịnị banyere onye ahụ mejọrọnụ? Olee ibu ọrụ dị n’ubu ya, ma ọ bụrụ na e nwere?
N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs sịrị: “Ya mere ọ bụrụ na ị na-eche onyinye gị n’ihu Chineke n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na nwanne gị nwere ihe megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, laba, buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụ bịakwa chee onyinye gị.” (Matiu 5:23, 24) Rịba ama na okwu Jisọs n’ebe a dịịrị onye mejọrọnụ. Olee ibu ọrụ o nwere idozi okwu ahụ? Iji zaa ya, ka anyị tụlee ihe okwu Jisọs pụtara nye ndị Juu narị afọ mbụ ahụ na-ege ntị.
“Na-eche Onyinye Gị n’Ihu Chineke”
N’ebe a Jisọs na-ese onyinyo doro anya: Onye Juu na-efe ofufe abịawo na Jerusalem maka otu n’ime ememe ndị a na-eme kwa afọ. O nwere onyinye—ma eleghị anya anụmanụ—ịchụrụ Jehova n’àjà.a Ịchụ àjà abụtụghị ememe okpukpe bụ ihe nkịtị. Akwụkwọ bụ́ Judaism—Practice and Belief na-akọwa, sị: “Ịhọrọ anụ ndị mara abụba, na-enweghị ntụpọ, ịhụ ka ndị ọkachamara nyochara ha, ịdọkpụrụ ha gaa yaadị ole na ole n’ebe ịchụàjà ahụ ọkụ na-enwu, inyefe ha, ịtụkwasị aka n’isi ha, ikwupụta adịghị ọcha ma ọ bụ ikpe ọmụma, ma ọ bụ n’aka nke ọzọ ịrara anụmanụ ahụ nye, ibewa akpịrị ya, ma ọ bụ ọbụna nanị ijide ya—ndị a mere ka e jide inwe nzube na ịdị egwu nke oge ahụ n’aka. . . . Ọ dịghị onye nke kwere na Chineke nyere iwu maka ofufe ahụ dum . . . nke pụrụ imezu ya n’abụghị onye o metụrụ n’ahụ.”
Okwu Jisọs na Matiu 5:23, 24 si otú a na-eburu ndị na-ege ya ntị gaa n’oge nke jupụtara ná nzube na egwu nye onye Juu na-efe ofufe. Otu ọkà mmụta Bible kọwara ọnọdụ ahụ otú a: “Onye ahụ na-efe ofufe abatawo n’Ụlọ Nsọ ahụ; ọ gabigawo ọtụtụ ụlọ nzukọ ya, Ụlọ Nzukọ Ndị Jentaịl, Ụlọ Nzukọ Ndị Inyom, Ụlọ Nzukọ Ndị Ikom. A gafee nke ahụ, e nwere Ụlọ Nzukọ Ndị Nchụàjà ebe onye nkịtị na-adịghị aba. Onye ahụ na-efe ofufe guzo n’akụkụ ya, dị njikere inyefe anụmanụ ya n’aka onye nchụàjà; aka ya dịkwasị [n’isi anụmanụ ahụ] ime nkwupụta.”
N’oge ahụ dị oké mkpa, onye ahụ na-efe ofufe echeta na nwanna ya nwere ihe megide ya. Ọ pụrụ ịbụ na akọ na uche ya na-agwa ya nke a, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ọ hụtawo site n’àgwà nwanna ya n’ebe ọ nọ na e nwere mmetụta nke mmejọ. Gịnị ka ọ ga-eme?
“Hapụ Onyinye Gị . . . , Laba”
“Hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà,” ka Jisọs na-akọwa, “laba.” N’ihi gịnị? Gịnị pụrụ ịdị mkpa n’oge ahụ karịa ịchụrụ Jehova àjà? “Buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo,” ka Jisọs na-akọwakwu, “mgbe ahụ bịakwa chee onyinye gị.” Ya mere onye ahụ na-efe ofufe na-ahapụ anụmanụ ya ná ndụ n’ebe ịchụàjà nke àjà nsure ọkụ ma laa ịga chọọ nwanne ya e mejọrọ.
Ebe ọ bụ ememe, ihe ịrụ ụka adịghị ya na nwanne ya ahụ ga-eso ná ndị bịara njem ofufe bụ́ ndị nutere na Jerusalem. Ebe okporo ụzọ nile dị warawara, a rụkọtachakwaa ụlọ ọnụ nke ukwuu, Jerusalem nwere ụba mmadụ buru ibu. Ma nke a bụ ememe, obodo ahụ jupụtakwara ná ndị ọbịa.b
Ọbụna ma ọ bụrụ na ndị si n’otu obodo agakọọ ọnụ ma makọọ ụlọikwuu ọnụ, ịgabiga n’obodo ahụ jubigara ókè iji chọta mmadụ ga-ewe mgbalị ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, n’oge Ememe Ụlọ Ntu, ndị ọbịa na-ewu ụlọ ntu n’akụkụ nile nke obodo ahụ na n’ụlọ na ubi nile dị gburugburu Jerusalem. (Levitikọs 23:34, 42, 43) Ka o sina dị, onye Juu ahụ na-efe ofufe gaje ịchọ nwanne ya e mejọrọ ruo mgbe ọ chọtara ya. Wee mezie gịnị?
“Mee ka gị na nwanne gị dị n’udo,” ka Jisọs na-ekwu. Okwu Grik a sụgharịrị ‘mee ka a dị n’udo’ sitere ná ngwaa (di·al·lasʹso) pụtara “‘ime ka e nwee ọdịiche, ịgbanwerịta ihe,’ n’ihi ya kwa, ‘ịdịghachi ná mma.’” Ebe o meworo mgbalị dị ukwuu iji chọta nwanne ya e mejọrọ, onye Juu ahụ na-efe ofufe na-achọ ime ka ya na ya dị n’udo. Mgbe ahụ, ka Jisọs kwuru, ọ pụrụ ịlaghachi n’ụlọ nsọ ahụ ma chee onyinye ya, n’ihi na ugbu a Chineke ga-anakwere ya.
Okwu Jisọs na Matiu 5:23, 24 si otú a na-akụzi ihe mmụta dị ike: Ime ka a dịghachi ná mma, ma ọ bụ udo, na-ebute ịchụ àjà ụzọ. Ụzọ anyị si emeso ndị ofufe ibe anyị nwere ihe jikọrọ ya na mmekọrịta anyị na Chineke kpọmkwem.—1 Jọn 4:20.
Ihe Ị Ga-eme Mgbe I Mejọrọ Ndị Ọzọ
Mgbe ahụ, gịnị ma ọ bụrụ na ị chọta onwe gị n’ọnọdụ nke a kọwara ná mmalite nke isiokwu a—ị hụtara na i mejọwo onye ofufe ibe gị? Gịnị ka i kwesịrị ime?
N’itinye ndụmọdụ Jisọs n’ọrụ, bute ụzọ n’ijekwuru nwanna gị. N’ebumnobi dị aṅaa? Ime ka ọ ghọta na ọ dịghị ihe mere o kwesịrị iji na-eche na e mejọrọ ya? Ee e ma ọlị! Nsogbu ahụ pụrụ ịkarị nanị nghọtahie nkịtị. ‘Mee ka a dị n’udo,’ ka Jisọs sịrị. O kwe omume, wepụ ihe ilu site n’obi ya. (Ndị Rom 14:19) Iji mezuo nke ahụ, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ikweta, ọ bụghị ịgọnahụ, mmetụta iwe ya. Ọ pụkwara ịdị gị mkpa ịjụ sị, ‘Gịnị ka m pụrụ ime iji dozie okwu?’ Ọtụtụ mgbe, arịrịọ sitere n’ezi obi agwụla ihe dị mkpa. Otú ọ dị, n’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa inye onye e mejọrọ oge iji dozie mmetụta ya.
Ma, gịnị ma ọ bụrụ na n’agbanyeghị mgbalị ndị i meworo ugboro ugboro ị pụghị ime ka a dịghachi ná mma? Ndị Rom 12:18 na-asị: “A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ị pụrụ isi otú a jide n’aka na ozugbo i meworo ihe nile ị pụrụ ime iji mee ka udo dị, Jehova ga-enwe obi ụtọ ịnara ofufe gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Oge a na-ewetakarị onyinye ịchụàjà bụ n’oge ememe atọ a na-eme n’oge dị iche iche—Ememe Ngabiga, Pentikọst, na Ememe Ụlọ Ntu.—Deuterọnọmi 16:16, 17.
b Atụmatụ dịgasị iche iche banyere ọnụ ọgụgụ ndị njem ofufe na-enute na Jerusalem oge ochie maka ememe ndị ahụ. Onye Juu narị afọ mbụ na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus mere atụmatụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị Juu atọ nọ ya n’Ememe Ngabiga.—The Jewish War, II, 280 (xiv, 3); VI, 425 (ix, 3).