Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 3/8 p. 29-30
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Ohi A Na-ezu na Chọọchị Britain
  • Nsikwopụ Afọ Ime Ka Ukwuu na Canada
  • Ụmụ Ọhụrụ Ndị Bu Ọrịa AIDS
  • Ụmụ Nwanyị Na-eme Ihe Ike Na-amụbawanye
  • Ndị Ụkọchukwu na Alụmdi na Nwunye
  • “Ndị Ji Ndidi Egbu”
  • Igbu Onwe Onye n’Àkwà Mmiri
  • Ọnwụ Ndị Metụtara Ụgbọ Ala
  • Ụmụaka Na-ese Siga
  • Ndebe Ọnụ Ọcha Maka Ndị Agadi
  • À Na-ere Anwụghị Anwụ Ere?
  • A Na-akatọ Usoro Ọgwụgwọ Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa
Teta!—1996
g96 3/8 p. 29-30

Ikiri Ụwa

Ohi A Na-ezu na Chọọchị Britain

“A dịghịzi ele ebe ndị a na-anọ efe ofufe anya dị ka ebe ndị dị nsọ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sunday Times nke London na-akọ. A na-ezu kandụl, oche ndị bishọp, oche ikpo okwu ndị e ji ọla brass mee, ololo ndị e nwere mgbe ụwa na-emepebeghị anya, na ihe mgbe ochie ndị e ji agbanye mmiri maka baptism site na chọọchị ndị dị n’England ma ree ha dị ka ihe ndị e ji achọ ubi okooko osisi mma. Azụmahịa nke a iwu na-akwadoghị zuru mba nile, a na-achọsikwa ihe nkà ndị ahụ e zuru ezu ike. A hụrụ otu enyo window e tejiri eteji nke na-efu efu n’otu ụlọ nri dị na Tokyo. Ihe na-efunahụ chọọchị dị iche iche kwa afọ na-eru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde $7. Ugbu a a na-etinye ọkpọka ígwè ọrụ ndị na-elekọta ihe, na-ewekwa ụlọ ọrụ nchebe n’ọrụ iji lekọta gburugburu ụlọ chọọchị.

Nsikwopụ Afọ Ime Ka Ukwuu na Canada

E sikwopụrụ ọnụ ọgụgụ dị elu nke 104,403 afọ ime na Canada na 1993, nke bụ́ mmụba nke 2.3 pasent karịa afọ gara aga. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star si kwuo, “nke ahụ bụ ngụkọta nke 26.9 nsikwopụ afọ ime maka 100 ụmụ ọ bụla a mụrụ.” Gịnị mere e ji nwee ịrị elu ahụ? Ọ bụ ezie na ụfọdụ ekwuwo na ihe kpatara ya bụ ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke obere ụlọ ọgwụ ndị na-esikwopụ afọ ime ndị na-abụghị nke ndị gọọmenti ná mba ahụ, ndị ọrụ Njikọ Òtù Ịbụ Nne na Nna A Haziri Ahazi nke Canada na-arụtụ aka ná nrụgide nke ọnọdụ akụ̀ na ụba dị ka “ihe bụ isi a na-ekwu mere e ji enwe nsikwopụ afọ ime.” Anna Desilets, onye ntụzi ukwu nke òtù Njikọ Maka Ndụ, bụ́ òtù na-akwado ndụ, na-eche na “ịdị mfe nke isikwopụ afọ ime na-eduga ndị mmadụ n’iji ya eme ihe dị ka ụzọ e si achịkwa ịmụ ụmụ, ná mfu nke ndị na-akwụ ụtụ isi.”

Ụmụ Ọhụrụ Ndị Bu Ọrịa AIDS

Ọnụ ọgụgụ ụmụ ọhụrụ bu ọrịa AIDS na Venezuela na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ El Universal nke Caracas na-akọ. “N’oge gara aga a kọrọ akụkọ na ihe dị ka ụmụaka abụọ ruo isii kwa afọ na-ebute ọrịa AIDS,” ka otu onye ọkachamara na-akọwa, “ma ugbu a anyị na-enwe site ihe dị ka ụmụaka abụọ ruo isii kwa izu.” Ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị bu ọrịa, bụ́ ndị na-ebufekwa ụmụ ọhụrụ ha nje ọrịa ahụ, na-arị elu kwa ụbọchị. “Ọ dị mkpa icheta,” ka akụkọ akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwubi, “na ndekọ ọnụ ọgụgụ nke Ministrị Ahụ Ike nyere na-egosipụta nanị akụkụ dị nta nke nsogbu ahụ.”

Ụmụ Nwanyị Na-eme Ihe Ike Na-amụbawanye

“Ndị inyom na-etinyekarị aka n’ime ihe ike karịa n’oge gara aga,” ka Tom Gabor bụ́ ọkà mmụta n’ihe banyere mpụ na Mahadum nke Ottawa na-azọrọ. “Ime ihe ike,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail na-akọ, “bụ nke ndị inyom na-edu ndú, kama ịbụ ndị nọ n’ọkwá nke abụọ, na-eme n’ụzọ na-arịwanye elu. Ndị a abụghị ndị nọ n’okpuru nwoke arụrụala riworo ahụ.” Ebubo mpụ ime ihe ike dị iche iche megide ndị inyom toruworo ogo mmadụ amụbawo site na 6,370 na 1983 gaa na 14,706 na 1993. Otú ọ dị, ndị ikom ka na-eme ihe ka ọtụtụ na mpụ ime ihe ike. Dị ka Globe ahụ si kwuo, “na 1993, 88.6 pasent nke ndị toruworo ogo mmadụ na 76.3 pasent nke ndị ntorobịa e kpere ikpe mpụ ime ihe ike bụ ndị ikom.”

Ndị Ụkọchukwu na Alụmdi na Nwunye

Akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ The Sydney Morning Herald kọrọ na ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị Katọlik ọnụ na-eru n’okwu na-ekwu na “nkwụsị nke ịbụ ndị a manyere ịnọ n’alụghị nwunye ga-enye aka ịkwụsị ụkọ nke ndị ụkọchukwu.” A na-ele ịnọ n’alụghị nwunye anya dị ka ihe bụ isi na-egbochi ụmụ okorobịa ịbanye n’ọkwá ụkọchukwu. N’ime ka nsogbu ahụ pụta ìhè, Herald ahụ nyere ọnụ ọgụgụ ụfọdụ na-eme ka a ghọta ihe. Ebe bụ isi a na-azụ ndị ụkọchukwu na New South Wales nwere nkezi nke ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 60 ndị na-abanye na ya kwa afọ site na 1955 ruo 1965. Ma ọnụ ọgụgụ kwekọrọ na nke ahụ n’agbata 1988 na 1994 bụ nanị mmadụ itoolu ndị na-abanye na ya kwa afọ. Osote onye ntụzi nke kọleji ọzọ ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu na Sydney kwuru na, n’echiche nke ya, ịhapụ ndị ndú okpukpe ka ha na-alụ nwunye pụrụ ịbụ mmeziwanye “dị ngwa” ma ọ bụghị ngwọta na-adịte anya nye ajọ ụkọ nke ndị ụkọchukwu e nwere n’Australia.

“Ndị Ji Ndidi Egbu”

Òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-anwa inweta $75 nde iji malite mwepụ nke ihe dị ka 110 nde ogbunigwe ndị e liri n’ala na 64 mba, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune na-akọ. Ọ na-efu nanị ihe dị ka $3 iji mepụta otu ogbunigwe e ji alụso ndị agha ọgụ (AP) nke na-ebughị ibu karịa otu mkpọ siga. Ma iji chọta ma wepụ ogbunigwe dị otú ahụ n’ala na-efu ihe dị n’agbata $300 na $1,000. Nsogbu ọzọ na-egbochi mwepụ nke ogbunigwe ndị ahụ. Otu ọnụ na-ekwuru òtù Mba Ndị Dị n’Otu kwuru, sị: “Kwa afọ a na-eli 2 nde ogbunigwe AP ndị ọhụrụ n’ala, tụkwasị na 100 nde na ụma ndị dị adị.” Ndị ọkachamara kwetara na ọ ga-ewe ọtụtụ iri afọ iji wepụsịa ihe otu onye ọchịagha Cambodia kọwara dị ka “ndị ji ndidi egbu, nke na-adịghị ada ada” n’ụwa.

Igbu Onwe Onye n’Àkwà Mmiri

Ihe karịrị otu puku mmadụ egbuwo onwe ha site n’ịwụpụ site n’elu Àkwà Mmiri Golden Gate a ma ama nke dị na San Francisco kemgbe e meghere ya na 1937. “Igbu onwe onye site n’isi n’elu Àkwà Mmiri Golden Gate wụpụ bụ ihe na-akpali akpali, ihe na-adọrọ adọrọ. Ọ mara mma nke ukwuu n’ebe ahụ. E nwere kpọmkwem ụdị echiche efu ọ gụnyere,” ka Richard Seiden bụ́ ọkachamara n’igbu onwe onye kwuru. Ole na ole ná ndị na-esi na ya awụpụ na-adị ndụ ịkọ akụkọ ya, nke na-abụghị ihe ijuanya ebe ọ bụ na ha na-adanye n’ime mmiri n’ọ̀tụ̀tụ̀ 120 kilomita kwa hour, ihe ndị dị ha n’afọ na-agbawakarị. Otu ihe ọmụmụ banyere 500 mmadụ ndị a rụgideworo ka ha ghara ịwụpụ kpughere na ihe na-erughị pasent 5 mesịrị gbuo onwe ha ka oge na-aga.

Ọnwụ Ndị Metụtara Ụgbọ Ala

N’inwe 26 ndị na-anwụ n’ime 100,000 mmadụ ọ bụla bi n’ime ya, Argentina nọ n’ihu ugbu a n’ụwa nile n’ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ n’ihe ọghọm ụgbọ ala, dị ka akwụkwọ akụkọ Argentina bụ́ Clarín si kwuo. Na 1993 e nwere 8,116 ọnwụ ndị dị otú ahụ ná mba ahụ. Ọnụ ọgụgụ ahụ rịrị elu ruo 9,120 na 1994. Ma n’ime ọnwa isii mbụ nke afọ 1995, e nweworị ihe karịrị 5,000 ọnwụ ndị metụtara ụgbọ ala. Na 1994 ihe dị ka 25 pasent nke ndị nwụrụnụ bụ ndị ji ụkwụ aga. Nanị n’ógbè Buenos Aires, ọnwụ ihe mberede okporo ụzọ ji 79 pasent mụbaa. Ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu nke ihe mberede ndị ahụ bụ n’ihi ọdịda ndị na-akwọ ụgbọ ala na-ada ilezi anya nke ọma mgbe ha na-agbafe ụgbọ ala ndị ọzọ.

Ụmụaka Na-ese Siga

Otu akụkọ 1993/1994 na-egosi na ọtụtụ n’ime ụmụaka karị na-ese siga na Britain. Ọnụ ọgụgụ ndị dị afọ 11 ruo 15 na-ese siga amụbawo site na pasent 10 gaa pasent 12. Mmụba nke a bụ okpukpu abụọ nke ihe ndị ọrụ ahụ ike gọọmenti tụrụ anya ya maka afọ 1994, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Independent na-ekwu. Ọ bụ ezie na e nwewo ndalata n’ọnụ ọgụgụ ndị toruworo ogo mmadụ na-ese siga, ihe dị ka 29 pasent nke ndị ikom Britain na 27 pasent nke ndị inyom ka na-ese siga. “Ọ pụrụ ịchọ ndalata ka pụta ìhè n’ọnụ ọgụgụ ndị toruworo ogo mmadụ na-ese siga tupu omume nke ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu abụrụ nke e metụtara n’ụzọ pụtara ìhè,” ka akụkọ ahụ na-ekwubi.

Ndebe Ọnụ Ọcha Maka Ndị Agadi

“Ndebe ọnụ ọcha pụrụ ịbụ okwu ọnwụ na ndụ nye ndị agadi,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Asahi Evening News na-ekwu. Ndị ọkà mmụta sayensị nke Japan na-ekwubi na “ndị agadi pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke oyi ịba n’ahụ nanị site n’ịsa ezé ha.” N’otu ihe ọmụmụ e mere banyere 46 ndị agadi, ndị nọọsụ sara ezé otu ìgwè nke 21 mmadụ nke ọma kwa ụbọchị mgbe ha risịrị nri ehihie. E nyochakwara ha maka ịdị ọcha nke ezé ugboro abụọ ma ọ bụ atọ kwa izu. Mgbe ọnwa atọ gasịrị a chọpụtara na 21 ndị ahụ enweghị ahụ ọkụ n’ime ụbọchị iri ma e jiri ya tụnyere 25 ndị ahụ na-agbasoghị ụzọ ime ihe ahụ. A sịrị na enweghị nje ọrịa n’ọnụ mere ka e nwee ahụ ike ka mma. Ihe ọmụmụ e buru ụzọ mee kwubiri na “asụ mmiri ma ọ bụ iberibe nri ndị e kubara n’akpa ume n’amaghị ama na-akpatakarị oyi ịba n’ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.

À Na-ere Anwụghị Anwụ Ere?

“Anwụghị Anwụ Pụrụ Ịbụ nke Gị, n’Ọnụ Ego $35,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Register-Guard nke Eugene, Oregon, U.S.A., na-azọrọ. James Bicknell bụ́ ọkà mmụta n’ihe ndị dị nta dị ndụ na-ekwu na ya ga-echekwa DNA gị ka ọ ga-abụ, dị ka akwụkwọ ahụ si tinye ya, “na narị afọ ọzọ ndị na-abịa n’ihu, onye na-ahụ n’anya nke sitere n’usoro ọmụmụ gị pụrụ iji ihe ọmụma ihe ndị ndụ dị na DNA ahụ pụtaghachi gị.” Dr. Bicknell na-ere otu akpa DNA nke ihe dị n’ime ya bụ ibé ákwà abụọ nje na-adịghị na ha na otu obere mkpọ ihe dị mmiri mmiri dị n’ime ya. “Ị ga-ehi ákwà ahụ n’akụkụ ntị gị,” ka ọ na-ekwu, “tinye ákwà ahụ n’ime ihe ahụ dị mmiri mmiri, ma ziteghachiri m ya.” Mgbe ahụ ọ na-ewepụta DNA dị ná mkpụrụ ndụ ndị e hichapụrụ n’ákwà ahụ ma na-etinye DNA n’ibé akwụkwọ e ji ayọcha ihe. Mgbe ahụ a na-echekwa ibé akwụkwọ ahụ n’ime tuub n’ime obere igbe aluminum nke e dekwasịrị aha gị n’elu ya ka i wee gosipụta ya otú o si masị gị. Guard ahụ na-ekwu, sị: “Ọ na-ekwubi na ndị mmadụ na-echekwa ntụ ndị nwụrụ anwụ, ùkwù ntutu na mbọ aka ndị e bepụrụ ebepụ. Otu igbe DNA bụ ihe a ga-enyefe ụmụ ụmụ.”

A Na-akatọ Usoro Ọgwụgwọ Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa

E nwere olileanya ndị dị elu afọ isii gara aga mgbe usoro ọgwụgwọ mkpụrụ ndụ ihe nketa n’ime mmadụ malitere na nke mbụ ya. Ka oge na-aga, ndị ọkà mmụta sayensị tụrụ anya ịgwọ ọrịa mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị e bu pụta ụwa site n’ịgbanye mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị na-edozi ihe n’ahụ ndị ọrịa ha. Ha nwekwara olileanya ịgbanye ihe ndị sitere ná mkpụrụ ndụ ihe nketa nke ga-eme ka mkpụrụ ndụ ndị na-emerụ ahụ, dị ka mkpụrụ ndụ ọrịa cancer jiri aka ha bibie onwe ha. Otú ọ dị, ka ọtụtụ nchọpụta e ji ịnụ ọkụ n’obi mee gasịrị, a na-amalite ịkatọ usoro ọgwụgwọ ahụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune na-ekwu, sị: “Maka nsogbu ụbụrụ nile, ọ dịbeghị otu akụkọ ọ bụla e bipụtara ebipụta banyere onye ọrịa e nyeere aka site n’usoro ọgwụgwọ mkpụrụ ndụ ihe nketa.” Ndị ọkà mmụta sayensị a ma ama na-eche na ọdịmma azụmahịa na nke onwe onye, ọ bụghị nchegbu maka ndị ọrịa, na-akwalite nchọpụta ahụ ngwa ngwa. Otu nsogbu bụ na ihe na-alụso ọrịa ọgụ n’ime ahụ pụrụ ịwakwasị ma bibie mkpụrụ ndụ ndị e ji usoro ọgwụgwọ mkpụrụ ndụ ihe nketa gwọọ, bụ́ nke na-ewere ha dị ka ndị si esi bịa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya