Enweghị Ọrụ—n’Ihi Gịnị?
N’ỌTỤTỤ mba a na-amanye ọtụtụ mmadụ ịkwado onwe ha site n’ọrụ ike a na-arụ ruo ọtụtụ hour n’ụzọ na-agwụ ike, ma eleghị anya ọbụna na-arụ ọrụ dị ize ndụ maka ụgwọ ọrụ dị nta. Ruo n’oge na-adịbeghị anya ọtụtụ ndị ná mba ndị ọzọ nwere obi ike na ozugbo nnukwu ụlọ ọrụ ma ọ bụ ngalaba gọọmenti na-ahụ maka ya were ha n’ọrụ, ha ga-enwe ọrụ nwere nchebe ruo n’ezumike nká. Ma taa o yighị ka a ka nwere achụmnta ego ma ọ bụ ụlọ ọrụ ndị nwere ike inye ọrụ dị mma na ịnọ ná ntụkwasị obi n’ọkwá ọ bụla. N’ihi gịnị?
Ihe Ndị Na-akpata Nsogbu Ahụ
Ọtụtụ puku ndị na-eto eto ọbụna apụghị ịchọta ọrụ mbụ ha—ma hà nwere akara ugo mmụta akwụkwọ ka elu ma ọ bụ na ha enweghị. Dị ka ihe atụ, n’Itali, ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị na-enweghị ọrụ bụ ndị nọ n’agbata afọ 15 na 24. Nkezi afọ ndụ nke ndị na-arụ ọrụ ma na-agbalị ijigide ọrụ ha na-arị elu, n’ihi ya kwa ọ na-esiri ndị na-eto eto ike karị ịchọta ọrụ mbụ ha. Ọbụna n’etiti ndị inyom—bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-arụ ọrụ—e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ oké elu nke enweghị ọrụ. N’ihi ya, ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị ọrụ ọhụrụ na-agbazi mgba ka e were ha n’ọrụ.
Malite n’oge e nwere ígwè mmepụta ihe mbụ, ụzọ ọhụrụ nke ịrụ ọrụ aka ebelatawo mkpa e nwere maka ndị ọrụ. N’agbanyeghị mgbanwerịta ọrụ dị ogologo ma na-agwụ ike, ndị ọrụ nwere olileanya na ígwè ọrụ ga-ebelata ọrụ ma ọ bụ ọbụna kachapụ ya. Usoro nke ngwá ọrụ ịrụ ọrụ n’onwe ya amụbawo mmepụta ihe ma belatakwa ọtụtụ ihe ize ndụ, ma o belatawokwa ọrụ. Ndị na-enwekwaghị ọrụ nọ n’ihe ize ndụ nke enweghị ọrụ ruo ogologo oge ọ gwụlakwa ma ha mụrụ nkà ndị ọhụrụ.
Anyị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị njupụta nke ngwá ahịa rikpuru. Ụfọdụ na-eche na anyị eruworị n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke uto. Ọzọkwa, ebe e nwere ọnụ ọgụgụ dị ala karị nke ndị e were n’ọrụ, e nwere ọnụ ọgụgụ dị ala karị nke ndị na-azụ ihe. Ahịa si otú a na-emepụta ihe karịrị ihe a pụrụ iji mee ihe. Ịbụ ndị na-enwekwaghị ike imepụta ihe, a na-emechi ma ọ bụ na-arụgharị nnukwu ígwè ọrụ ndị a rụrụ iji hụ maka ịrị elu ná mmepụta ihe nke a na-atụ anya ya. Ọnọdụ ndị dị ka ndị a na-enwe ndị na-ata ahụhụ ya—ndị na-aghọ ndị na-enweghị ọrụ. N’oge ndalaga azụ nke akụ̀ na ụba, ịchọ ndị ọrụ na-ebelata, ọ na-esikwa nnọọ ike inwetaghachi ọrụ ndị a tụfuru n’oge ndalaga azụ nke akụ̀ na ụba. N’ụzọ doro anya, enweghị ọrụ nwere ihe karịrị otu ihe na-akpata ya.
Ihe Otiti Ọha Mmadụ
Ebe ọ bụ na ọ pụrụ imetụta onye ọ bụla, enweghị ọrụ bụ ihe otiti ọha mmadụ. Mba ụfọdụ na-ewepụta atụmatụ dịgasị iche iche maka ichebe ndị ka na-arụ ọrụ—dị ka ihe atụ, oge ọrụ e gburu nkenke karị n’ime izu ya na ụgwọ ọrụ e mere ka ọ dị ala. Otú ọ dị, nke a pụrụ ibibi olileanya ndị ọzọ na-achọ ọrụ.
Ma ndị nwere ọrụ ma ndị na-enweghị ọrụ na-emekarị mkpesa ugboro ugboro banyere nsogbu ndị metụtara ọrụ. Ma ebe ọ bụ na ndị na-enweghị ọrụ na-achọ ọrụ ọhụrụ, ndị nwere ọrụ na-agbalị ichebe ịnọ ná ntụkwasị obi nke ha—ebumnobi abụọ ndị na-adịghị adabakọ mgbe nile. “A na-akpọkarị ndị nwere ọrụ òkù ịrụ ọrụ ruo ogologo hour karị. Ndị na-enweghị ọrụ na-anọgidekwa n’enweghị ọrụ. E nwere ihe ize ndụ na ọha mmadụ pụrụ ikewa abụọ . . . n’otu aka, ndị nwere ọrụ gabiga ókè, n’aka nke ọzọkwa, ndị a jụrụ ajụ na-enweghị ọrụ, bụ́ ndị fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha na-adabere n’obi ebere nke ndị ọzọ,” ka magazin ndị Itali bụ́ Panorama na-ekwu. Na Europe, ka ndị ọkachamara na-ekwu, n’ụzọ bụ isi ndị nwere ọrụ ha na-arụ anụwo ụtọ nke uto akụ̀ na ụba, ọ bụghị ndị na-enweghị ọrụ.
Ọzọkwa, e jikọtara enweghị ọrụ n’ọnọdụ akụ̀ na ụba dị ná mba, nke mere na n’ime mba ụfọdụ, dị ka Germany, Itali, na Spain, ọdịiche buru oké ibu dị n’agbata mkpa nke otu ógbè na ndị ọzọ. Ndị ọrụ hà dị njikere ịmụta nkà ndị ọhụrụ ma ọ bụ ọbụna kwaga n’ógbè ọzọ ma ọ bụ ná mba ọzọ? Nke a pụrụ ịbụ ihe na-ekpebikarị ihe.
È Nwere Ihe Ngwọta Ndị Dị Nso?
N’akụkụ ka ukwuu, e nwere olileanya n’ịkawanye mma nke ọnọdụ akụ̀ na ụba. Ma ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ wee na-eche na nkawanye mma dị otú ahụ agaghị ewere ọnọdụ ruo n’ihe dị ka afọ 2000. Nye ndị ọzọ, mgbake amaliteworị, ma ọ dịghị arụpụta ihe ngwa ngwa, dị ka ndalata e nwere n’iwere ndị mmadụ n’ọrụ n’Itali n’oge na-adịbeghị anya na-egosi. Mgbake ọnọdụ akụ̀ na ụba apụtachaghị mbelata n’iwere ndị mmadụ n’ọrụ. Ọ bụ ezie na uto dị mma, achụmnta ego dị iche iche na-ahọrọ iji ndị ha were n’ọrụ eme ihe n’ụzọ ka mma kama iwe ndị ọzọ n’ọrụ—ya bụ, e nwere “uto nke enweghị ọrụ.” Ọzọ, ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị ọrụ na-eto ngwa ngwa ọtụtụ mgbe karịa ọnụ ọgụgụ ọrụ ọhụrụ ndị a na-ekepụta.
Taa ọnọdụ akụ̀ na ụba mba na-aghọ ihe zuru ụwa ọnụ. Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ọnọdụ akụ̀ na ụba chere na iwulite nnukwu ógbè azụmahịa metụtara mba ndị ọzọ, dị ka ndị nke Nkwekọrịta Nzụkọrịta Ahịa nke Ebe Ugwu America (NAFTA) na Njikọ Aka Akụ̀ na Ụba Esia na Pacific (APEC), pụrụ ịkwalite ọnọdụ akụ̀ na ụba ụwa n’otu aka ahụ. Otú ọ dị, ọnọdụ a na-akwali nnukwu ụlọ ọrụ dị iche iche iguzobe onwe ha n’ebe ọrụ dị ọnụ ala karị, nke na-eme ka mba ndị na-emepụta ngwá ahịa ghara inwe ọrụ. N’otu mgbe ahụ, ndị ọrụ a na-adịghị akwụ ego buru ibu na-ahụ na obere ego ha na-akpata na-adịwanye nta. Ọ bụghị ihe dapụtara na mberede na n’ime ọtụtụ mba, ọtụtụ ndị emewo ngagharị iwe, ọbụna n’ụzọ ime ihe ike, megide nkwekọrịta azụmahịa ndị a.
Ndị ọkachamara na-atụ aro ọtụtụ ụzọ isi lụsoo enweghị ọrụ ọgụ. Ọbụna ụfọdụ na-emegide onwe ha, na-adabere na ma ọ̀ bụ ndị ọkachamara n’ọnọdụ akụ̀ na ụba, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ ndị ọrụ n’onwe ha tụrụ ha. E nwere ndị na-ekwe ụlọ ọrụ dị iche iche nkwa ihe mkpali iji mụbaa ndị ọrụ ha site n’ibelata ụtụ isi ha ga-akwụ. Ụfọdụ na-enye ndụmọdụ ka gọọmenti mee ihe siri ike banyere ya. Ndị ọzọ na-atụ aro ka e kesaa ọrụ n’ụzọ dị iche ma belata hour e ji arụ ọrụ. E meworị nke a n’ụfọdụ nnukwu ụlọ ọrụ, n’agbanyeghị na n’ime narị afọ gara aga, e jiriwo nwayọọ nwayọọ belata oge e ji arụ ọrụ n’ime izu ná mba nile bara ọgaranya, n’enweghị mbelata n’enweghị ọrụ. “N’ikpeazụ,” ka ọkachamara n’ọnọdụ akụ̀ na ụba bụ́ Renato Brunetta na-ekwusi ike, “usoro ọ bụla na-aghọ nke na-adịghị irè, na-enwe ọnụ ahịa ndị na-akarị uru.”
“Anyị ekwesịghị ịghọgbu onwe anyị,” ka magazin bụ́ L’Espresso na-ekwubi, “nsogbu ahụ siri ike.” Ò siri oké ike ịgwọta? È nwere ihe ngwọta nye nsogbu nke enweghị ọrụ?
[Igbe dị na peeji nke 8]
Nsogbu Oge Ochie
Enweghị ọrụ bụ nsogbu dịteworo anya. Ruo ọtụtụ narị afọ ndị mmadụ site n’oge ruo n’oge achọtawo onwe ha n’enweghị ọrụ n’amaghị ụma. Ozugbo ọrụ gwụrụ, ọtụtụ iri puku ndị ọrụ e ji arụ ọrụ ná nnukwu ihe owuwu dị iche iche na-aghọ ndị na-enweghị ọrụ n’onwe ha—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ruo mgbe e were ha n’ọrụ n’ebe ọzọ. Ka ọ dị mgbe ahụ ha na-adị ndụ a na-ejighị n’aka, n’igbu ya nkenke.
Na Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, “ọ bụ ezie na nsogbu enweghị ọrụ n’ụdị ọ dị ugbu a adịbeghị mgbe ahụ,” e nwere ndị na-enweghị ọrụ. (La disoccupazione nella storia [Enweghị Ọrụ n’Akụkọ Ihe Mere Eme]) Otú ọ dị, n’oge ahụ, a na-ewerekarị ndị na-adịghị arụ ọrụ dị ka ndị na-abaghị n’ihe ma ọ bụ ndị na-enweghị ebe obibi. Ruo na narị afọ nke 19, ọtụtụ ndị Britain na-eme nnyocha “jikọtara ndị na-enweghị ọrụ karịsịa ná ‘ndị na-akpa aghara’ na ndị mwagharị, bụ́ ndị na-ehi n’èzí ma ọ bụ na-akpagharị n’okporo ámá n’abalị,” ka Prọfesọ John Burnett na-akọwa.—Idle Hands.
“Nchọpụta a chọpụtara enweghị ọrụ” weere ọnọdụ na nso ngwụsị nke narị afọ nke 19 ma ọ bụ ná mmalite nke 20. E guzobere òtù ọrụ pụrụ iche nke gọọmenti ka ha leba anya ma gwọta nsogbu ahụ, dị ka Kọmitii A Họpụtara Ahọpụta nke Ụlọ Ndị Nkịtị nke Ndị Britain n’ihe banyere “Nhụjuanya Site n’Ụkọ Ọrụ,” na 1895. Enweghị ọrụ aghọwo ihe otiti ọha mmadụ.
Ihe ọmụma ọhụrụ a toro n’ụzọ dị oké ngwa, karịsịa mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị. Agha ahụ, ya na mmepụta ìgwè ngwá agha ya, fọrọ nke nta ka o kpochapụ enweghị ọrụ. Ma na-amalite n’afọ ndị 1920, Ebe Ọdịda Anyanwụ ụwa chere ọtụtụ ndalaga azụ ihu bụ́ nke mesịrị ruo n’Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba ahụ malitere na 1929 ma metụta ọnọdụ akụ̀ na ụba mmepụta ihe nile nke ụwa. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, ọtụtụ mba nwere uto dị oké ngwa nke akụ̀ na ụba, enweghị ọrụ belatakwara. Ma “a pụrụ ịchọpụta mmalite nke enweghị ọrụ taa laa azụ n’etiti nke afọ ndị 1960,” ka Òtù Na-ahụ Maka Njikọ Aka na Mmepe nke Akụ̀ na Ụba na-ekwu. Iwe ndị mmadụ n’ọrụ nwere ọdachi ọhụrụ nke ọgba aghara mmanụ nke afọ ndị 1970 na mmụba nke ihe ọmụma kọmputa kpatara, tinyere ịchụ mmadụ n’ọrụ ndị sochiri ya. Enweghị ọrụ amalitewo ịrị elu na-adịghị akwụsị akwụsị, na-abanye ọbụna ná ngalaba ọrụ ọfịs na nke ndị nlekọta ndị e cheburu na ha nọ ná nchebe.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ịchọ inwetakwu ọrụ agaghị agwọta nsogbu enweghị ọrụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Reuters/Bettmann