Ahụ Ike na Gburugburu Ebe Obibi
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Nigeria
Nde mmadụ 49 na-anwụ kwa afọ n’ụwa nile. Ihe dị ka 75 pasent n’ime ọnwụ ndị a bụ ọnwụ nnwụchu, ihe na-akpata ya bụkwa ọnọdụ ebe obibi na ụzọ ịdị ndụ na-adịghị mma, dị ka otu akụkọ nke Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) si kwuo. Tụlee ihe atụ ụfọdụ:
◼ Ọrịa “cancer” na-egbu nde mmadụ ise kwa afọ. Ihe ka ukwuu na nke a, ka WHO na-akọ, “ka a na-ekwu na ihe kpatara ya bụ oké ịrị elu n’ise siga n’ime 30 afọ gara aga.”
◼ Ọrịa ọgbụgbọ na ọnyụnyụ, nke ihe na-akpatakarị ya bụ nri na mmiri na-adịghị ọcha, tinyekwara enweghị ịdị ọcha kwesịrị ekwesị, na-egbu ihe karịrị nde ụmụntakịrị atọ kwa afọ.
◼ Ụkwara nta, nke na-egbu nde mmadụ atọ kwa afọ, na-agbasa n’ọnọdụ ịda ogbenye na ụba mmadụ gabigara ókè, karịsịa ebe e nwere ọnọdụ ịdị ọcha dị ala.
◼ Ọrịa usoro iku ume, karịsịa oyi ịba n’ahụ, na-egbu nde ụmụaka atọ na ọkara na-erubeghị afọ ise kwa afọ. Ọtụtụ bụ ndị bi n’obodo ukwu ndị e kpughere nye ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ikuku e metọrọ emetọ.
E wezụga ihe ndị a na-egbu egbu, kwa afọ ihe dị ka ijeri mmadụ abụọ na ọkara—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa—na-arịa ọrịa ndị na-esite ná mmiri na-ezughị ezu ma ọ bụ nke e metọrọ emetọ na ọnọdụ ịdị ọcha dị ala. Tụkwasị na nke ahụ, WHO na-ejikọta nchegbu ndị dị ugbu a dị ka mmiri ozuzo acid, mbelata nke ihe nchebe ozone, na ikpo ọkụ nke ụwa ná mbelata nke ahụ ike nke ọtụtụ ndị. Ná nchịkọta, ka akụkọ òtù WHO ahụ rịbara ama, ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ bi na gburugburu ebe obibi na-eyi ndụ ma ọ bụ ahụ ike egwu.
Dr. Hiroshi Nakajima, onye ntụzi ukwu nke òtù WHO, na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na anyị emeghị ihe ugbu a, ọgba aghara maka Ụwa na ndị bi n’ime ya ga-aghọ ihe jọrọ njọ n’ụzọ a na-apụghị ịnagide anagide, na-enwe gburugburu ebe obibi na-enwekwaghị ike ịkwado ndụ.”
Bible na-ekwe nkwa na oge ga-abịa mgbe ‘onye obibi ya na-agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.’ (Aịsaịa 33:24) A ga-emezu nke a, ọ bụghị site ná mgbalị ụmụ mmadụ, kama site n’Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-ekpochapụ ọrịa na ihe na-akpata ha.—Mkpughe 21:3, 4.
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 12]
Godo-Foto