Olee Ebe Ndị ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi Nọ?
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SPAIN
“Ọ dịghị ihe na-enwe mmetụta ọjọọ n’ebe okpukpe nọ dị ka enweghị mmasị.”
EDMUND BURKE, NWA AMAALA BRITAIN ỌNỤ NA-ERU N’OKWU NKE NARỊ AFỌ NKE 18.
OBERE obodo bụ́ Caleruega dị n’ala dị larịị nke ifufe na-efesi ike n’ebe ugwu nke Spain. Ebe kasị mkpa n’obodo ahụ nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya bụ otu ebe obibi mara mma nke ndị nọn bụ́ nke yiri ụdị ndị dị na Rom. E wuru ya 700 afọ gara aga iji kwanyere Domingo de Guzmán ùgwù, bụ́ onye guzobere usoro okpukpe Dominican, onye a mụrụ n’ebe a. Ndị nọn họọrọ ibi ndụ ịgba nkịtị na nke nkewapụ ebiriwo n’ebe obibi ndị nọn ahụ ruo narị afọ asaa.
Elu ụlọ ebe obibi ndị nọn ahụ na-ehi mmiri, mgbidi oge ochie ahụ na-amalitekwa ịda. Ma nne nwanyị ahụ bụ́ onye ndú na-enwe nchegbu banyere ndakpọ nke sara mbara karị—ọdịda nke okpukpe n’onwe ya. “Mgbe m batara n’ebe obibi ndị nọn ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 30 afọ gara aga, e nwere 40 ndị nọn n’ebe a,” ka ọ na-akọwa. “Ugbu a anyị dị nanị 16. E nweghị ndị na-eto eto. O yiri ka ọrụ okpukpe bụ ihe oge ya gafeworo.”
Ihe na-eme na Caleruega na-ewere ọnọdụ n’ebe ka ọtụtụ na Europe dum. E nwebeghị nnupụta nke echiche ndị na-emegide okpukpe, ọ bụ nanị mgbahapụ e ji nwayọọ na ọchịchọ obi na-eme. Katidral ndị a ma ama na Europe bụ ihe nkiri nye ndị na-eme njem nleta kama ịbụ nke na-adọta ndị “kwesịrị ntụkwasị obi” nọ n’ebe ahụ. Chọọchị ndị a na-apụghị imeri emeri n’otu oge—ma ọ̀ bụ Protestant ma ọ bụ Katọlik—bụ nke enweghị mmasị na-erikpu. Nchegbu ihe nkịtị kama nke okpukpe bụ ihe bụ isi ná ndụ ndị mmadụ—ọnọdụ ọnụ ndị na-ekwuchitere chọọchị na-akpọ ịgbanwe ihe gaa n’ihe nkịtị. Okpukpe eyikwaghị nnọọ ka ò nwere ihe ọ pụtara. Ọnọdụ okpukpe dị na Europe ọ̀ pụrụ ịbụ ihe mgbaàmà nke ndalata yiri nke gaje imetụta akụkụ ndị ọzọ nke ụwa n’isi nso?
Gịnị Na-eme Ọnụ Ọgụgụ Ndị Na-aga Chọọchị?
Ihe ijuanya nke a abụghị ihe ọhụrụ n’ebe ugwu Europe. Nanị pasent 5 nke ndị Scandinavia bụ́ ndị okpukpe Lutheran na-agachi chọọchị anya. Na Britain nanị pasent 3 nke ndị sịrị na ha bụ ndị Anglikan na-aga nzukọ ofufe na Sunday. Ma ugbu a, ndị Europe bụ́ ndị Katọlik n’ebe ndịda yiri ka ha na-agbaso ihe nlereanya nke ndị agbata obi ha n’ebe ugwu.
Na France, bụ́ mba ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ya bụ ndị Katọlik, nanị 1 nwa amaala n’ime 10 ọ bụla na-aga chọọchị otu ugboro n’ime izu. N’ime 25 afọ gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị Spain na-ele onwe ha anya dị ka “ndị ji Katọlik kpọrọ ihe” adalatawo nke ukwuu site na 83 pasent gaa na 31 pasent. Na 1992, achịbishọp sitere Spain bụ́ Ramon Torrella gwara nnọkọ nkwurịta okwu maka ndị mgbasa akụkọ na “Spain abụghị mba Katọlik; ndị mmadụ na-aga ngagharị Izu Dị Nsọ na Mas Krismas—ma ọ bụghị [ịga Mas] kwa izu.” Mgbe popu letara Madrid na 1993, John Paul nke Abụọ dọrọ aka ná ntị na “ọ dị Spain mkpa ịlaghachi na mkpọrọgwụ ya nke ịbụ ndị Kraịst.”
Ọnọdụ enweghị mmasị n’okpukpe emetọwo ndị ụkọchukwu tinyekwara ndị aghasa. Ọnụ ọgụgụ ndị e chiri echichi ụkọchukwu ọhụrụ na France adalatawo gaa na 140 na 1988 (ihe na-erughị ọkara nke ọnụ ọgụgụ ahụ maka 1970), ebe e nwere ihe dị ka 8,000 na Spain ndị gbahapụworo ọkwá ụkọchukwu iji wee lụọ nwunye. N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị nọgideworo na-ejere ìgwè atụrụ ha ozi na-enwe obi abụọ banyere ozi ha. Nanị 24 pasent nke ndị Sweden na-ekpe okpukpe Lutheran chere na ha pụrụ “iji akọ na uche dị ọcha” kwusaa banyere eluigwe na hel, ebe otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị ụkọchukwu France na-enwe ọbụna obi abụọ banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs.
Ibute Ihe Ụtọ na Nhọrọ Ụzọ Tupu Nraranye Okpukpe
Gịnị na-anọchi anya okpukpe? N’ọtụtụ ebe obibi, ntụrụndụ anọchiwo anya ofufe. Na Sunday ezinụlọ dị iche iche na-aga n’ụsọ mmiri dị iche iche ma ọ bụ n’ugwu kama ịga chọọchị. “Ịga Mas na-agwụ ike,” ka Juan, bụ́ otu nwa okoro sitere Spain kpọrọ n’ubu wee kwuo. Ihe omume okpukpe apụghị ịma egwuregwu bọl ma ọ bụ ihe ngosi egwú pop aka, bụ́ ihe omume ndị na-adọrọ ìgwè mmadụ jupụta n’ámá egwuregwu dị iche iche.
Ndalata n’ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị abụghị nanị ihe àmà nke ndalata okpukpe. Ọtụtụ ndị Europe na-ahọrọ iwere na ịhọrọ echiche okpukpe nke ha. N’oge a, nkụzi okpukpe ndị a nakweere pụrụ inwe ihe dị nta ha jiri yie nkwenkwe onwe onye nke ndị na-ekwu na ha na-ekpe okpukpe ahụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Europe—ma hà bụ ndị Katọlik ma ha bụ ndị Protestant—ekwekwaghị n’ịdị ndụ mgbe ọnwụ gasịrị, ebe ihe karịrị 50 pasent nke ndị Katọlik na France, Itali, na Spain na-ekweghịkwa n’ọrụ ebube.
O yiri ka ndị ndú enweghị ike igbochi uto a dị ngwa nke enweghị nkwekọrịta. Ọ dịbeghị ebe nke a pụtara ìhè karịa ná mkpọsa popu megide usoro nchịkwa ọmụmụ. Na 1990, Popu John Paul nke Abụọ gwara ndị Katọlik na-emepụta ọgwụ ka ha ghara ire ọgwụ na-egbochi ịtụrụ ime. Ọ zọọrọ na ọgwụ ndị a “na-emegide iwu dị iche iche nke ebumpụta ụwa n’ụzọ na-emebi ùgwù onwe onye mmadụ.” N’otu aka ahụ, akwụkwọ Catechism of the Catholic Church na-ekwusi ike na “ịhụnanya mmekọahụ nke nwoke na nwanyị si otú a na-eguzo n’okpuru ibu ọrụ dị abụọ nke ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye na ịmụ ụmụ.”
N’agbanyeghị iwu ndị a siri ike, ọtụtụ di na nwunye bụ́ ndị Katọlik na-eme ihe masịrị ha. A dịghị ahụkebe ezinụlọ ndị nwere ihe karịrị ụmụ abụọ ugbu a ná mba Katọlik ndị dị n’ebe ndịda Europe. Na Spain, condom—nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-ere na nzuzo n’iri afọ abụọ gara aga—ka a na-akpọsa mgbe mgbe na telivishọn, nanị pasent 3 nke ndị inyom France bụ́ ndị Katọlik na-ekwu na ha nakweere iwu ndị ndú Katọlik mara megide usoro nchịkwa ọmụmụ.
N’ụzọ doro anya, ndị Europe na-agbahapụ chọọchị na ozizi ha. Achịbishọp Anglịkan nke Canterbury bụ́ George Carey kọwara n’ezoghị ọnụ ọnọdụ dị na chọọchị ya: “Anyị anọwo na-anwụ nwayọọ nwayọọ,” ka o kwuru, “nke ahụ bụkwa okwu dị oké ngwa nke anyị na-aghaghị iche ihu.”
Ọ bụghị kemgbe ọgba aghara nke Mgbanwe ahụ ka nnukwu ihe owuwu okpukpe nke Europe yiworo ihe na-ama jijiji nke ukwuu. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị Europe jiworo ghara inwe mmasị n’okpukpe? Gịnị bụ ọdịnihu okpukpe?